Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ladysmith Black Mambazo eriela Grammy ọzọ
Ndị otu egwu Black Mambazo nke Sawt Afịrịka nwetere ọkwa ka ndị ewu ha kachasị nkeọma na uwa niile na ngalaba ndị Grammy Awards kpọrọ 'World Music'.
Black Mambazo nwetere ọkwa na Grammy Award nke enyere ụnyahụ na New Yọk na mba Amerịka.
Abalị ahụ nke Bruno Mars nwekarịrị nrite Grammy.
Nke mere ya ụgboro ise Black Mambazo nwetere Grammy.
Ọ ha mere ka ụwa niile mata maka egwu ndị zulu a na-akpọ isicathamiya.
Egwu ha jiri nwete Grammy a bụ "Shaka Zulu Revisited: 30th Anniversary Collection".
Egwu a bụ nke ha ji kwanye ndị hiwere otu ha ụgwụ. Ndị a hiwere otu a arituola.
Gọọmentị Sawt Afịrịka zịpụrụ tweet ha ji kene ndị Black Mambazo.