Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Mberede ụgbọoloko egbuola mmadụ abụọ, ma merụọ iri ise ahụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ụgbọoloko abụọ kụkọrọ ihu na ihu na South Carolina dị na mba Amerịka, wee gbuo mmadụ abuọ ma merụọ ihe karịrị iri asatọ ahụ.
Ihe mberede a mere taa bụ ụbọchị uka.
Ọ bụ ụlọọrụ oloko a na-akpọ Amtrak nakwa ọzọ a na-akpọ CSX nwe ụgbọoloko ndi a ihe mberede a mere.
E bugara ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.
Onye na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ nzọpụta na South Carolina kwuru na ndị merụrụ ahụ na mberede a gbajiri ọkpụkpụ.
Ha kwukwara na galọnụ mmanụ ugbọala ruru puku ise wufuru n'ala, mana onweghị ihe omere maka na ọkụ agbaghị ya.
Akụkọ ka na-abịa.