Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ntọrọ Dapchi: Kọmitii etinyela anya maka ụmụakwụkwọ a tọọrọ
Gọọmentị etiti ahọpụtala mmadụ iri na abụọ ga-achọpụta ihe gbasara ụmụakwụkwọ 110 atọrọla n'obodo Dapchi n'izu gara aga.
Minista ọrụ mgbasa ozi bụ Lai Mohammed depụtara akwụkwọ gosiri na ọ bụ Babagana Monguno bụ onye ndụmọdụ gbasara nchekwa Naịjirịa kpọkọrọ kọmitii a.
N'akwụkwọ ozi ha zipuru ndị ntaakụkọ, kọmitii nke a ga-enyocha ọnọdụ ndị ji egbe tọrọ ụmụakwụkwọ a, ma tinyekwa anya na ndị agha chere nche na Dapchi oge mpkamkpa a mere. Ihe kachasị mkpa bụ ị leba anya n'etu ha ga-esi zọpụta ụmụakwụkwọ a.
Kọmitii nke a ga-ede akwụkwọ nchọpụta ha nke mbu n'ubọchị 15 nke ọnwa Maachị n'afọ 2018.
Ndị ga-eso n'otu a bụ ndị agha ala, agha mmiri, agha elu, ndị uweojii, DSS bụ otu ndị na-echekwa na nzuzo na otu dị icheiche ndị ọzọ.
Mana ihe a mere na Dapchi nwere ike itinye ụjọ n'ahụ ọtụtụ nne na nna gbasara iziga ụmụ ha akwụkwọ dịka senatọ Ben Bruce kwuru.