Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Offa: Ndịohi egbuola mmadu 17
Mmadụ karịrị mmadụ iri na ise anwụọla, n'ime ha ndị uweojii itoolu mgbe ndịohi bu egbe wakporo ụlọakụ ruru ise n'obodo Offa dị na Kwara steeti ụbọchị Tọọdse.
Ndị nọ ebe ihe a mere sị na ndịohi ahụ ji ogbunigwe gbawa ebe ụlọakụ ahụ na-echekwa ego mmadu tupu ha-eburu ya pụọ.
Ha kwukwara na ndị a bu ụzọ ga n'ụlọọrụ ndị uweoji gbagbuo ihe niile ha hụrụ ebe ahụ tupu ha gaa ebe ụlọakụ ndị ahụ dị.
Ha gbakwara mbo gbochie ụzọ abụọ batara obodo ahụ si na Ilorin n'Osogbo, obodo ndị agbatobi dị nso n'Offa.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ajayi Okasanmi (DSP) onye kwuru na nke a bụ ezie kwukwara na ndị omekome ahụ gburu ndị nkịtị asaa.
Akụkọ ga-amasị gị
Ihe a wutere ndị mmadụ nnukwu dịka ha gosiri n'elu atụmatụ mgbasa ozi: