Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ebidola usoro ichutu osote gọvanọ Imo steeti n'oche - TOE Ekechi
Mgbe e biputara ya
N'oge na-adịghị anya, Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo steeti nwere ike ịbụ onye na-enweghị ọrụ ọzọ.
TOE Ekechi gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ụlọomeiwu nke Imo Steeti na-akwado ichutu Madumere.
Akụkọ kwuru na ndị omeiwu na-ebo Madumere ebubo oke nrụrụaka.
Maka nke a, e hibere kọmitii mmadụ isii ga-etinye uchu n'inyocha ebubo ndị a e boro ya ma gwakwa ndị ụlọomeiwu n'ime ụbọchị asaa.
Gee ihe Ekechi nwere ikwu gbasara ihe a n'uju ebe a: