Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Linda Ikeji amụọla nwa mbụ ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Linda Ikeji bụ onye nwe ihe e ji agbasa ntaakụkọ dị icheiche amụọla nwa mbụ ya n'ụlọọgwụ na mba Amerịka n'ụbọchị 17 nke ọnwa Septemba 2018.
Linda depụtara afọ ojuju ya n'ozi o dere n'akara soshal midia nke Twitter ya.
N'ọnụ ya "Chukwu nna, abụrụla m nne. Baby J abịala ụwa, a mụrụ ya taa."
Ndị mmadụ jisiike ekele ya ma na-asị nwa ya nnọọ.
Amabeghị ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị ka ọ mụrụ, mana a na-anụ kepu kepu na ọ mụrụ nwoke.
Cheta na Linda gbawara 'internet' mgbe akụkọ pụtara na ọ dị ime, ebe rue ugbua, amagbeghị onye tụwara ya ime.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: