Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
#NassProtest: Kwụọ anyị ụgwọọnwa - Ndịọrụ NASS
Bukola Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu na ogbo ya n'ụlọomeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara ekwela ndị ọrụ ụlọomeiwu nkwa na ha ga-agba mbọ inweta ego n'ụzọ ọzọ were kwụọ ha ụgwọ ndị e ji ha.
Ndị na-arụ n'ụlọomeiwu mere ngagharịiwe taa bụ Tuzdena-eti mkpu ka a kwụọ ha ụgwọọnwa ndị e ji ha.
Ha kwuru na ọ bụrụ na emezughi ihe ha na-achọ, na ha agaghị ekwe ka ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta nwee ọgbakọ ha.
Ha na-ekwu ka e wepụta akwụkwọ mbuli n'ọkwa nakwa inwere n'ọrụ ndị otu ha, ma kwụọkwa ha ụgwọ niile e ji ha.
Ha kwuru na e meghị nke a, na ha ga-akwụsị ọrụ n'abalị iri na atọ nke ọnwa Disemba.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: