Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Mberede okporoụzọ egbuola ụmụakwụkwọ 21 na ndị nkuzi
Mgbe e biputara ya
Ụmụakwụkwọ iri abụọ na otu na ndị nkuzi abụọ si njem mmụta anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ dị na Kano steeti.
Ha si obodo Misau dị na mpaghara ugwu-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe ha gara njem mmụta ihe bekee kpọrọ 'excursion'.
Ha bụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Junịọ Sekọndrị, Misau.
Ndị otu Federal Road Safety Commission (FRSC) nke Kano steeti, na ndị isi ụlọakwụkwọ ha gwara BBC na ụgbọala bu ụmụakwụkwọ a na ụgbọala ukwu kụkọtara isi ọnụ.
Mmadụ niile ahụ nwụrụ n'ebe ahụ ozugbo. Nanị otu nwata akwụkwọ na otu onye nkuzi nwụfọrọ.