Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ndị uweojii na Spain anwụchiela otu na-azụ ohu akwụna
Ndị uweoji na mba Spain a tọghapụ la ụmụnwaanyị ruru iri atọ n'itoolu esi na Naịjiria bubata na Spain ị rụ ọrụ akwụna.
Ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị a ndị emere ntọghapụ bụ ụmụaka anwụchịrị n'ike na Naịjịrịa ma tinye kwa ha n'ọrụ ahụ n'ike.
Europol bụ otụ ndị uweoji nke mba Europe ekwuola na ha chọtara ụmụnwaanyị a ebe ha bi n'ime ọgba ebe otu ahụ jichiri ha.
Ha sị kwa na otu ahụ ama ama tinyere ụmụnwaanyị ahụ n'ọrụ maka ị kwụghachị ụgwọ ruru nde euro iri atọ ha boro ụmụnwaanyị ahụ.
Mmadụ ruru iri asato n'itoolu ka anwụchiri n'okwu a, n'ime ha bu onye egwu Naịjiria ama ama mana enyebeghị aha ya.
Ejichiri ya ebe ọ sị Spain a laghachi Naịjiria mgbe ọ rụchara ihe onyonyo egwu ya.
Akụkọ ga-amasị gị: