Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ọkụ ụgbọala agbagbuola ndịuweojii ise nọ n'ọzụzụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ihe ruru mmadụ ise bụ ndịuweojii nọ n'ọzụzụ (nke bekee kpọrọ cadet) anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ.
Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha.
Onye otu ha a kpọrọ @cadet_suhail mara ọkwa ọnwụ ha na Twitter ka o kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee.
O kwuru sị ka ndị mmadụ tinye ha n'ekpere.
O mechara kwuo na otu n'ime ha bụ onye nke mezuru ha mmadụ ise, nwụrụ n'ụlọọgwụ.
O gosikwara ụgbọala ha gbara ọkụ.
Lee ihe otu n'ime ha dere tupu ọ nwụọ:
Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa