Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Fayose na Ben Bruce ekelela Melaye maka ilaghachi na PDP
Aka na-achị Ekiti steeti bụ Gọvanọ Ayo Fayose na Sinetọ Ben Murray Bruce ekelela Dino Melaye maka ịhapụ otu pati APC laghachi n'otu PDP.
Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchịte Kogi-West bidoro ịnọnyere ndị ogbo ya ndị omewu taa.
Ọ hapụrụ ọnọdụ ndị APC n'ụlọ omeiwu ukwu rịọ ka ya nọrọ na nke ndị PDP n'ihi dịka o siri kwuo, ọnịnọ ya n'otu APC adịghịzị ya mma n'ahụ.
Fayose kwuru na nlaghachi Dino Melaye n'otu PDP bụ ihe dị mma ma na-egosi oke ọdachi ga-eme n'APC, na ndị PDP ndị ọzọ gara na APC ga-alọghachi".
N'otu aka ahụ, Ben Bruce bụ Sinetọ na-anọchite anya Bayelsa-East gosiri oke ọṅụ n'ihe Dino Melaye mere.
Bruce kwupụtara n'igwe okwu Twitter ya sị: "Ọ bụ ihe ọṅụ ịnabata Dino Melaye n'ụlọmeiwu Sineti taa. Anyị ji obi anyị niile anabata ya n'oke pati anyị bụ PDP. Anyị ga-eme gị nke ọma. Anyị agaghị akpagbu maọbụ megbuo gị."
Sineto Melaye na ndị ọrụ nchekwa ala anyị na-agba egwu agwara ọgwa kemgbe otu ọnwa nke bere n'ụlọọgwụ n'Abuja ebe ọ na a nata nleta maka mmerụ ahụ.
Cheta na n'ọnwa gara aga, a nwụchiri Sinetọ Melaye dịka ọ na-achọ ịfepụ gaa mba Moroko mana e mechara hapụ ya.
Mana ha wakporoya n'ụlọ ya dị n'Abuja ma nwuchikwa ya ọzọ kpụrụ ya gawa Lokoja maka ịzara ọnụ ya n'ikpe banyere ndị ntọ a nwụchịkọrọ na Kogi steeti.