Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Esemokwu 'African Queen': Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Esemokwu dị n'etiti ndị otiegwu abụọ bụ Tuface na Blackface amalitela ọzọ.
Ka ọ dị ugbua, Innocent Idibia a ma dịka 'Tuface', akpụpụla onye otiegwu ibe ya bụ Augustine Ahmedu, ụlọịkpe maka ihe gbasara egwu 'African Queen' ha abụọ dekọrọ kemgbe afọ 2004.
Blackface bụ onye gosiri akwụkwọ ahụ Tuface na onyeisi ụlọọrụ egwu ya bụ Efe Omoregbe gbara ya n'ụlọikpe, n'elu akara Instagram ya.
Akwụkwọ Tuface gbara Blackface bụ maka mmetọ aha ya, ruru nde naịra iri ise.
Nke a emeela ka ndị mmadụ pụta n'elu soshal midia ịrịọ tuface ka ọ gbaghara Blackface.
@ED_daps kwunyeere Tuface n'azụ, sị ya gaa n'ihu gbaa Blackface akwụkwọ:
@Ose-wavez chetaara Tuface na Blackface enweghi ụdịrị ego ahụ.
@ChinnyPillz kwuru na Tuface ekwesịghi ịgba Blackface akwụkwọ ebe ọ ma na o nweghị ụdịrị ego ahụ.
@Bayotweets101 na-arịọ Tuface ya biko meere Blackface ebere.
Efe Omoregbe gwara BBC na o teela aka Blackface na-erite ihe kwesịrị ya site n'egwu 'African Queen' ha abụọ dekọrọ n'afọ 2004.