Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Dino Melaye na-efu efu kemgbe ụtụtụ Tọọsde
Ndị uweojii n'Abuja ekwuola na ha amaghị maka ntọrị onye sinetọ na-anọchite mpaghara ọdịda anyanwụ Kogi steeti n'ụlọ sineti bụ Dino Melaye.
Akụkọ gbara n'ụtụtụ taa bụ Tọọsde bụ na ndị ntọrị tọọrọ Dino n'ụzọ ebe ọ na-aga Kogi steeti maka ikpe a gbara ya ebe ahụ.
Akụkọ ahụ nke sinetọ si Bayelsa steeti bụ Ben Murray Bruce dere n'akara twitter ya kwuru na ndị ntọrị ahụ ji egbe tọọrọ Dino n'ụtụtụ taa. O kwuru na ha ji ụgbọala Sienna.
Onye bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode dekwara na twitter ya ma katọọ ya bụ ntọrị ma rịọ ka ha kpọlọta ụlọ n'udo.
Mana ndị uweojii n'Abuja gwara ndị ntaakụkọ Sun n'ekwentị na ha amaghị maka ya bụ ntọrị.
Onye nkwuchiteọnụ ha bụ Anjiguri Manzah gwara ha na ha enwetebeghi ozi maka ntọrị ahụ.
BBC Igbo gbara mbọ inweta ya n'ekwentị mana ọ zaghị.
Mana kemgbe ụtụtụ ahụ a tọrọ ya, o nwebeghị onye kwuru okwu banyere ya gụnyere ndị pati ya PDP.