Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Buhari efeela aka njem London ọzọ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ozi na-eru anyị ntị bụ na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ga-achị Naịjirịa ụbọchị iri Buhari na-agaghị anọ ya.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-eme njem na London echi bụ Tọọsde ebe ọ ga-ezu ike ọrụ ụbọchị iri.
Ozi si n'aka onye ndụmọdụ ya bụ Femi Adesina, nke o dere n'akara Twitter onyeisiala kwuru na Yemi Osinbajo ga-achị Naịjirịa n'ụbọchị ndị ahụ.
Iwu Naịjirịa nke afọ 1999 kwadoro ka onyeisiala nye osote ya ọchịchị mgbe na ọ nọghị na mba.