Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Naịjirịa ga-abụ ọka ibe na mmanụ gasị - NLNG
Akụkọ ndị dị mkpa
Ụlọọrụ na-esi mmanụ gasị bụ NLNG n'ịchafụ ekwuola na ọ bụrụ na mkpebi ntinye ego ọhụrụ ha nweisi n'ọnwa Disemba, na ọ ga-eme Naịjirịa mba nke atọ Kachasị n'ibupụ mmanụ gasị n'ụwa niile.
Ebe Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ na Naịjirịa bụ Ibe kachukwu ekwuola ma ntuliaka afọ 2019 agaghị egbochi atụmatụ ọma ụlọọrụ ahụ nwere.
Otu jikọtara ụmụIgbo nọ na mba ofesi bụ World Igbo Congress agbarụọla ihu ma katọọ gọọmentị na-achị naịjirịa ugbua kwuo na ha ji ndị ọrụ nchekwa ebuso ndị na-ama ha aka n'ihu agha.
Ozi a si n'akwụkwọ onyeisi oche ha bụ ọkanmụta Anthony Ejiofor n'ọgbakọ ha mere n'ọgbakọ ha mere na mba Amerịka.
Na Mba Ndị ọzọ:
Ọrịa ebola ka na-aga n'ihu n'iwakpo ndị mba D.R Congo dịka nke malitere ọhụrụ a gburula mmadụ karịrị iri atọ.
Otu ahụike n'ụwa bụ World Health Organisation kwuru na nke a nwereike iraahụ n'ịchikọta.
N'egwuregwu,
Akwa daara n'Enugwu n'isi ụtụtụ ụnyaahụ mgbe otu onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Lamray United bụ Sunny Supremo Chukwu si n'ụra fee n'ọnwụ.
Akụkọ kwuru na o mere mkpesa gbasara obi mgbu tupu ọ na-ehi ụra n'abalị ahụ.
Nkeji Nke ụtụtụ a:
Ihe nkiri nke taa;