Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Akpabio agbaala arụkwaghịm
Onye ndu ndị kachasị nta n'ụlọomeiwu ukwu a na-akpọ 'Minority Leader' n'asụsụ bekee bụ Godswill Akpabio arịtuola n'ọkwa ya.
O kwuputara nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ n'akara soshal midia ya.
Ndị mmadụ na-ekwu na o nwereike ị gafere na pati ndị APC mana o kwubeghị ya n'onwe ya.
O kelere ndị ụlọomeiwu na nkwado niile ha nyere ya mgbe ọ bụ onyeisi ha.
Nke a na-abịa dịka ya na Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari nwere nzụkọ na London na ngwụcha izuụka gara aga.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o bụ etu a ka ekwesiri ị si mee ma onye chọọ ịfee na pati ọzọ dịka @giftedbroda si kwuo.
Ebe ndị ọzọ na-akatọ ya na-ekwu na ọ bụ onye mmehie dịka @stainlesphoenix si kwuo.
Akụkọ ga-amasị gị