Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Dino Melaye enyefela ndị uweojii onwe ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Sineto Dino Melaye na anọchite Kogi n'ụlọomewu enyefela onwe ya ndị uweojii.
Akụkọ kwuru na ndị uweojji kpụrụ ya gawa n'isi ụlọrụ ha dị n'Abuja.
Ndị uweojii wakporo ụlọ Melaye dị na Maitama , Abuja abalị asaa gara aga kwechiri, jụ ọpụpụ..
Mbọ Melaye gbara iji sị n'ikike ụlọikpe chụpụ ha kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọikpe jụrụ ịza ekpere ya.
Kemgbe abalị ole na ole, Ndị uweojii chọrọ ka Melaye bịa zara ọnụ ya banyere ebubo gbasara ogbugbu mmadụ nakwa ohi.
Akụkọ ka na-abịa.