Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Certificate of Return: APC akwọpụla aka n'isi Rochas?
Mgbe e biputara ya
Odee akwụkwọ pati APC bụ Lanre Isa-Onilu agwaala ndị ntaakụkọ na ha agaghị enyerenwu Rochas Okorocha aka ịnwete asambodo mmeri ya.
Ọ kwuru na ọ bụ maka na ha kwụsitụrụ ya ọrụ mere na ya bụ Okorocha enwebeghị ọnụ ịbia kpesara pati ahụ ihe gbasara asambodo mmeri ya.
Onilu kwuru na ọ bụrụ na nkwụsị ọrụ Rochas bie, pati etinye ọnụ n'okwu ya.
Cheta na Inec jụrụ ịnye Rochas Okorocha asambodo mmeri ya n'ụlọomeiwu ukwu maka ebubo imagide onye ọrụ Inec dịka onye meriri ntuliaka.