Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Zamfara Killings: Buhari amachiela ngwuputa olaedo na steeti ahụ
Mgbe e biputara ya
Ọ bụ site n'akara Twitter nke Bashir Ahmad bụ onye enyemeka pụrụiche n'ihe gbasara mgbasa ozi ka ozi a pụtara.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na ọ bụ olaedo na-esere ndị mmadụ na Zamfara ha ji emefu ndụ ha.
N'ime otu ozi ahụ onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị mbịarambịara niile na-arụ ọrụ na mpaghara ahụ ha pụọ.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa pụrụiche nke a kpọrọ "Puff Adder" ga-anọchị ebe ahụ niile maka nchekwa.