Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ijegun fire disaster: Nnukwu ọkụ gbagbuola mmadụ abụọ ma erepịa ọdọahịa 15
Ngalaba na-ahụ maka ihe gbata gbata bụ nke Bekee kpọrọ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) ekwuola na mmadụ abụọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba mere na mpaghara Ijegun dị na Legọọs.
Ya bụ ọkụ bidoro mgbe ndị na-ezu ọhị mmaụ agbịdị gbapuru igwe mmanụ n'Ijegun.
NEMA kwuru na mmadụ 12 merụrụ ahụ ebe ụgbọala 31 gbara ọkụ.
Dịka NEMA si kwuo, eburula mmadụ anọ n'ime ha gawa ụlọọgwụ mahadụm Lagọs, ebe asatọ ndị ọzọ n'ụlọ ọgwụ Gbagada.
Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri ọkụ na-ere ka ndị mmadụ na-agba ọsọ.
Ndị be ebe ahụ gwara BBC na ọ bụ ndị bịara abịa kpara ike a ma kwukwa na ọbụghi mbụ ụdịrị ihe a na-eme.
"Ọkụ dị otu a gbakwara n'afọ 2008. Arịrịọ anyi bu ka gọọmentị bịa me ihe maka ihe a."