Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ministers and their portfolio: Ihe ndị mịnịsta ga-arụ ugbua
Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola ndị mịnịsta ọhụrụ n'iyi ọrụ taa ma nyekwa onye ọbụla n'ime ha ngalaba ọ ga na-elekọta.
Mana e nwere ụfọdụ ngalaba nke onyeisiala kewapụtara ọhụrụ.
Ha gunyere ngalaba "Human Affairs, Disaster Management and Social Development; Police affairs, nakwa Special Duties and International Affairs".
Onyeisiala kewakwara ụfọdụ ngalaba bụ ndị ekpokọtabụrụ ọnụ.
Ọmụmaatụ bụ ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik, ọrụ na ụlọ obibi nke a kpọrọ "power, works and housing" na Bekee.
E kewara ha ụzọ abụọ ka ngalaba nke ọkụ latrik dịrị iche, ebe ngalaba nke ọrụ na ụlọ obibi dịkwa iche.
Onyeisiala kpokọkwara ngalaba "Finance" na "Budget and National Planning" ọnụ.
Lezie etu Buhari siri kee ọrụ:
Ndị ọzọ bụ
Ndị ntorobịa Igbo gara n'ihu kwuo ihe ha chọrọ n'aka ndị minista ọhụrụ a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: