Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Rochas Okorocha: EFCC anatala ikike ịjichi akụnaụba Okorocha na nwunye ya
Ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ ekwuola na ha anatala ikike ịjichi akụnaụba Rochas, nke nwunye bụ Nneoma nakwa nke nwa ya nwaanyị.
Onyeisi ụlọọrụ ha n'Enugwu bụ Usman Imam gwara ndị ntaakụkọ nke a dịka ọ na akọwa ka ha si rụọ ọrụ n'ọnwa asaa gara aga.
Ha kwukwara na ha jichiri ụlọ ozọ nke otu Paschal Obi bụbu onye enyemaka Okorocha na nwa ya nwaanyị.
Imam kọwara na ha malitere nyocha Rochas na ezinaụlọ ya ma kwuo na ha ga-azara ọnụ ha n'okwu a.
Ihe ndị ha jichiri gụnyere ụlọ-obibi ruru asatọ, otu ụlọ oriri, ụlọakwụkọ abụọ, ụlọahịa nakwa otu ụlọọgwụ.
"Anyị na-agbalị ịnapụta ihe ndị a n'aka Okorocha kpam kpam ma nyeghachi ya ndị Imo steeti" ka o kwuru.