Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Xenophobia: Ụmụafọ Naịjirịa ọzọ esila Saụt Afrịka lọta
Mgbe e biputara ya
Ụmụafọ Naịjirịa dị narị atọ na iri na anọ esila mba Saụt Afrịka lọta Naịjirịa n'ụbọchị Tuuzde 18 Seputemba, 2019.
Ụgbọelu Air peace bu ha wuchiri n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs n'ihe dịka elekere asaa nke abalị.
Onyeisi ụlọọrụ Naịjiria na-enye ikike njem na mba Saụt Afrịka bụ Anthony Ogbe nọkwa n'ụgbọelu ahụ mgbe ọ lọtara.
Abike Dabiri kwukwara na gọọmentị steeti dị iche iche nọkwa ebe ahụ ịnabata ndị nke ha.
O kwukwara na ha ga-enye ndị niile lọtara ego iji gbaa ụgbọala, nri oriri nakwa 'sim kad' ọhụrụ.