Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
E menyụọla ọkụ na-agba ahịa Ogbete, Enugwu
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
E menyụọla ọkụ ọgbụgba dapụtara n' ahịa Ogbete dị n'Enugwu n'ehihie Fraide, ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 2020, tupu o mebie nnukwu ihe.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru n'ọ bụ ọdọ ndị na-ere 'foam' ebe 'Railway' ka ya bụ ọkụ na-agba.
Otu onye n'ime ha kpọrọ onwe ya 'Nnadozie' kwuru na ọkụ ahụ bidoro n' igwe na-enye ọkụ latrik a dọwara n'elu ụlọ dị n'ahịa ahụ ma feesee n'ngwa ahịa ndị mmadụ kwasara n'elu ụlọ.
Mana ndị ahịa menyụrụ ya ma kwụsị ya ịbanye n'ime ọdọahịa ndị mmadụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: