Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Moses Ebere, onye mmepụta ejije Nollywood a ma ama alaala mụọ
Mgbe e biputara ya
Otu onye katara ahụ n'imepụta ejije na Nollywood bụ Moses Ebere, anwụọla.
Dịka ogbo ya bụ Sunny Mac Don, si gwa BBC Igbo n'ekwentị, Ebere, onye nwe ụlọọrụ mmepụta ihe ejije a kpọrọ, 'Aim and See Entertainment', nwụrụ abalị abụọ gara aga nke bụ ụbọchị Tuzde.
Macdon gara n'ihu kwuo, " Ọ yaghị ahụ, ọ nabara ụra mana o teteghị."
Ihe ndị i kwesịrị ị ma maka Moses Ebere
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Benin'
- Ihe ejiji ọ hazierela gụnyere 'Spanner Goes to Jail'
- Ebere bụ onye Abia steeti
Akụkọ ka na-abịa.