Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
A nwụchiela onye a ma ama maka ebubo idina ụmụakwụkwọ FUTO n'ike
A nwụchiela nwataakwụkwọ mahadum 'Federal University of Technology' Owerri (FUTO) a na-ebo ebubo idina ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị mahadum ahụ n’ike.
Ndị uweojii Nekede nwụchiri Okoroafor Emmanuel Chinedu bụ nwataakwụkwọ ahụ nọ n’afọ ikpeazụ ya na mahadum Futo.
A sị na Okoroafor jiiri ọkwa ya dịka onyeisi otu nchekwa Man-O-War na mahadum FUTO na-akwaso ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị iko n’ike aghara aghara.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru n'ezie na ndị uweojii nwụchiri Okoroafor.
Okoye kpuhere nke a n’ụbọchị Mọnde abalị15 Julaị 2024 oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ya n’ekwentị.
Ọ sịrị, “Anyị nwetara mkpesa ma nwụchie nwataakwụkwọ ahụ a na-enyo enyo maka ị bụ onye na-akwaso ụmụakwụkwọ iko n’ike aghara aghara."
"Anyị na-eme nnyocha miri emi ugbua iji chọpụta ogogo arụ ọ kparala.”