Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ụdị ‘structure’ m chere Peter Obi kwesịrị inwe tupu ọ chọwa ịbụ onyeisiala - Ned Nwoko
Mgbe e biputara ya
Ned Nwoko bụ onye ndọrọndọrọọchịchị na ojiegoachụego akọwarala BBC Igbo ihe o chere maka okwu ọtụtụ mmadụ kpụ ọnụ ugbua bụ 'structure' Peter Obi kwesịrị inwe tupu o chee ịbụ onyeisiala Naịjirịa.
O kwukwara na o so kwadokwa nloghachite Peter Obi na People's Democratic Party - PDP.
Ọkparaeze Nwoko gara ihu kọwaa ihe 'structure' a na-ele anya pụtara.
Ọ si na structure pụtara ndị niile ga-emejupụta ndị gọvanọ, ndị ụlọomeiwu ụkwụ ma nta. N'uche ya, ọ bụ ndị a niile ga-eme ka ọchịchị ya pụta ihe.