Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Bishọp Matthew Kukah: Na ntuliaka 2027, tụọ nụ vootu 'ka unu dị ndụ'
Bishọp Chatolic dayosis na Sokoto steeti bụ Matthew Kukah ekwuola na etu ụmụ Nigeria si tụọ vootu na ntuliaka afọ 2027 na-abịa abịa ga-ekpebi 'na ha achọrọ ịdị ndụ'.
Bishop Kukah mere ka a mata nke a mgbe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ maka ntuliaka Nigeria ga-eme n'afọ 2027.
Kukah gwara ndị na-eto eto ka ha "tụọ vootu ga-eme ka ha dị ndụ".
N'okwu ya "anyị nwereike ịta ụlọọrụ INEC ụta, anyị nwereike ịta gọọmenti maọbụ ndị ọrụ nchekwa ụta; mana ikpeazụ onweghị onye tinyere gị egbe n'isi na-agwa gị tinyere onye nke a maọbụ onye nke ọzọ vootu".
"Ihe anyị kwesiri ime dịka ịntaneti dị ugbu bụ mgbe ọbụla m maọbụ onye ọbụla kwuru na ya chọrọ ịụ gọvanọ maọbụ Onyeisiala maọbụ onye omeiwu biko gaa n'ịntaneti, gụọ maka m".
"Gụọ ihe m mepụtagoro. Mara ọtụtụ maka m".
Ndụmọdụ m na-enye ndị na-eto eto
Bishọp Kukah gara n'ihu nye ndị na-eto eto ndụmọdụ ma sị "biko nu tụọ nụ vootu ka unu dị ndụ".
"Maka na ọ bụ anyị niile ga-ata ahụhụ maọbụ rie uru mkpụtara ihe ọbụla anyị mere".
Maka na aka anyị niile adịghị ọcka dịka anyị chere na anyị dị".