El-Nino: Etu ihe ndapụta ihu igwe ga-esi emetụta ndị Nigeria na ihe i kwesịrị ime iji chekwa onwe gị

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ ihu eluigwe bụ 'Nigerian Meteorological Agency' (NiMet), adọọla aka na ntị na El Niño nwere ike ịgbanwe usoro mmiri ozuzo na okpomọkụ n'akụkụ dị iche iche Nigeria, nke nwere ike imetụta ọrụ ugbo, mmiri na ọkụ latrik.
Nke a na-abịa dịka ozi ịdọ aka na ntị si mba na otu dị iche iche gụnureere United Nations nakwa WHO na-adapụta banyere El-Nino.
Ụlọọrụ 'Climate Impact Lab' kwuru na nso nso a na ihe ruru mmadụ 31,400 nwere ike ịnwụ na Nigeria maka oke ekpomọkụ nke ga-eso El Niño.
Mana, ọ bụ gịnị bụ El Nino?
Gíni bu El-Nino?
Ọnọdụ a nwere ike ịgbanwe etu ikuku si agba gburugburu ụwa, ma metụta oke mmiri ozuzo na okpomọkụ n'akụkụ dị iche iche.
El Niño bụ akụkụ na-ekpo ọkụ nke usoro mgbanwe ihu eluigwe a na-akpọ El Niño-Southern Oscillation (ENSO). Usoro a gụnyekwara La Niña, nke bụ akụkụ oyi ya.
Etu El-Nino nwere ike isi metụta Nigeria

Ebe foto si, Getty Images
N'ime ozi ọkwa ihu eluigwe nke Ọgọstụ 2026 na nke mmiri ozuzo maka Ọgọstụ, Septemba na Ọktoba 2026, NiMet kwuru, sị: "Nnyocha e mere n'oge na-adịbeghị anya banyere ọnọdụ oke osimiri na-egosi na El Niño amalitela n'afọ 2026."
Ụlọọrụ ahụ gbara ama na mmiri ozuzo nwere ike ịkarị nke a na-ahụkarị n'akụkụ ụfọdụ n' Ugwu Nigeria gụnyere Sokoto, Kebbi, Zamfara, Katsina, Kano, Yobe, Borno, Bauchi na Jigawa.
N'aka nke ọzọ, a tụrụ anya na mmiri ozuzo ga-adị obere n'akụkụ ụfọdụ nke ndịda, ọkachasị Oyo, Ogun, Osun, Ekiti, Edo na Delta, nakwa akụkụ ụfọdụ nke Kogi na Benue.
Na-agbanyeghị ọkwa maka ihu eluigwe, ọ pụtaghị na a ga-enwe otu ụdị ihu eluigwe kpọmkwem n'ebe niile.
Mmetụta o nwere ike inwe n'ọrụ ugbo

Ebe foto si, Getty Images
Mgbanwe mmiri ozuzo nwere ike imetụta oge ịkụ ihe ọkụkụ, uto ha na oge owuwe ihe ubi. Mmiri na-ezughị ezu nwere ike ime ka ihe ọkụkụ ghara ito nke ọma, ebe oke mmiri nwere ike imebi ubi ma bute idei mmiri.
NiMet dụrụ ndị ọrụugbo ọdụ ka ha na-enyocha amụma ihu eluigwe, na-ewepụ ahịhịa na-achọghị ma na-eleba anya n'ọrịa na ụmụ ahụhụ nwere ike imetụta ihe ọkụkụ.
N'ebe a na-atụ anya oke mmiri ozuzo, ọ dị mkpa ka ndị ọrụugbo na-ekocha ọwa mmiri ma na-eme ihe ga-enyere aka igbochi idei mmiri n'ubi ha.
Mmiri na ọkụ latrik
Oge mmiri ozuzo na-ezughị ezu nwere ike ibelata mmiri dị n'osimiri, ọdọ mmiri na ebe a na-echekwa mmiri. Nke a nwere ike ime ka mmiri ghara izuru ezinụlọ, ọrụ ugbo na ụlọ ọrụ.
NiMet dọrọ aka na ntị na mmiri na-erughị n'ebe a na-emepụta ọkụ eletrik site n'ike mmiri nwere ike ibelata mmepụta ọkụ.
Ụkọ mmiri nwekwara ike ime ka mmiri na-abanye n'ime ala iji mejupụta mmiri dị n'okpuru ala belata, ọkachasị n'ebe a na-amịpụta ya nke ukwuu.
Agbanyeghị, ihe ndị a bụ ihe ize ndụ nwere ike ịpụta ma mmiri ozuzo belata; ha apụtaghị na ụkọ mmiri maọbụ nkwụsị ọkụ ga-eme n'ezie.
Mmetụta o nwere ike inwe n'ahụike

Ebe foto si, Getty Images
Mgbanwe ihu eluigwe nwere ike imetụta ahụike ọha.
Ọmụmaatụ: Mmiri na-anọ n'otu ebe nwere ike ime ka anwụnta mụbaa, nke nwere ike ibute mmụba ọria.
Maka etu ọ ga-esi metụta ahụike gị, Dọkịnta Eze Nwite dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla belata ịga ije n'anwụ ọ kachasị n'Elekere iri abụọ nke ehihe ruo Elekere Anọ nke mgbede.
O kwuru ka onye ọbụla na-aṅụ mmiri etu o kwesiri ma kpọọ oku ka gọọmenti nakwa ụlọọrụ ahụike dị iche iche gbaa mbọ fesaa ozi nye ọhanaeze iji hụ na ha chekwara onwe ha.

Ebe foto si, Dr Eze Nwite
Dkta Nwite kwuru sị, " Echela ka akpịrị kpọọ gị nkụ tupu gị aṅụọ mmiri iji zere ụkọ mmiri n'ahụ."
"Ọ dị ezigbo mkpa ịṅu mmiri mgbe niile ka ọ na-anọchi mmiri nke na-apụ n'ahụ site n'okpomọkụ."
" Gọọmentị kwesịrị ịkọwara ndị mmadụ site na mgbasa ozi dị iche iche dịka social media, onyonyo, na redio ka ọha na eze ghọta ihe El Niño bụ na etu ha ga-esi chekwaa onwe ha."
NiMet dọrọ aka na ntị na ọnọdụ ihu igwe dị oke njọ nwekwara ike imetụta mmepụta nri ma mee ka erighị ezigbo nri na-edozi ahụ nke ọma bawanye.
Ind ndị ọzọ i kwesịrị ime

Ebe foto si, Getty Images
NiMet kpọrọ oku ka a na-enyocha ọkwa maka ihu eluigwe ma na-agbasa ozi ya n'oge, ka ndị ọrụ ugbo, obodo na ndị ọchịchị nwee ike ịkwadebe.
Ụlọọrụ ahụ tụrụ aro ka ndị ọrụugbo tụlee ụdị ihe ọkụkụ ndị na-anagide ụkọ mmiri, nakwa ka a na-echekwa mmiri ma na-emezi akụrụngwa ịgba mmiri n'ubi.
NiMet si kwa na ọ dịkwa mkpa ka ndị ọchịchị na obodo dị iche iche nwee atụmatụ maka idei mmiri na ụkọ mmiri.































