Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 20, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 20, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ndị ọrụ nchekwa anwuchiela ma kpụpụ mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị ndị na-aga ime National Youth Service Corps n'ụlọikpe Ọkaikpe Emeka Uzoma Orafu nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Owerri, Imo State.
- Cheta na ndị ntọrị tọọrọ mmadụ ruru iri abụọ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị na-aga ime NYSC n'obodo Umunoha nke okpuruọchịchị Mbaitoli n'abali nke mbụ n'ọnwa October ma mechaa tọhapụ ndị ha tọọrọ n'abalị asaa n'ọnwa October 2026.
- Ndị Alberta na mba Canada na-eme ntuliaka Bekee kpọrọ 'referendum' ịmara na ha aga-anọ na mba Canada maọbụ na ha aga-apụ na mba ahụ.
- Ndị ọchịchị Alberta kwuru na mmadụ nde ise na ọkara '(5.5 million)' so tụọ vootu ahụ mana ka ọnọdụ dị ugbua ọtụtụ n'eme ha anabataghị nwereonwe Alberta dịka ndị na-akwado nwereonwe Alberta na-ekwu na a ga-emeghali ntuliaka 'referendum' n'afọ 2030.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






