'Ọ bụ site n'ịrụsi ọrụ ike ka 'Black Market' ji ritere m GWR'

Omowunmi Dada bụ onye ihe ejije Nollywood aha ya na-akpọtụ dịka ihe ejije o mepụtara ọ kpọrọ, 'Black Market' kụwara efere ngụkọ 'Guinness World Record(GWR) maka ngosi a kachasị kirie n'otu mgbe.
Onye jibu nzere ahụ bụ onye ihe ejije nke ya bụ mmadụ 43,000 kiriri mana 'Black Market' bụ mmadụ 51,000 kiri ya n'otu mgbe.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere maka ya bụ ihe ịtụnanya, Omowunmi kwuru na ọ bụ mkpụrụ sitere n'ịrụsi ọrụ ike.
"Arọrọ m nrọ, mana nrọ agaghị abịa na mmezu ma ọ bụrụ na arụghị ọrụ maka ya."
"Ọ bụrụ na mụ enwetaghị ọzụzụ iji bụrụ ezigbo onye na-eme ejije, ọ bụrụ na m na-akpa ajọ agwa, ọ bụrụ na anaghị agba onwe m ume kwa ụbọchị. "
Dada kwuru na inwe akara aka ezughị.
"Ọ bụghị naanị inwe ebumnobi, i kwesịrị ịmepụta ya. Ọ bụ gị maara etu ị ga-esi mee ya. Chukwu enyela nrọ ahụ mana ị chọrọ ya nke taa nke echi? Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-arụ ọrụ dị na ya. Abụ m onye kwenyere n'iji olileanya arụ ọrụ. Ọ bụrụ maka iso ụzọ dị mfe, mba agaghị m eso ya."
Kirie ya n'uju: n'ihe onyonyo dị n'elu:



