Lee obodo Dangbe-Klounon dị na Porto-Novo nke mba Benin Republic ha na-agwọ na-ebikọ
Lee obodo Dangbe-Klounon dị na Porto-Novo nke mba Benin Republic ha na-agwọ na-ebikọ
Mgbe e biputara ya
Ndị obodo Dangbe-Klounon nke Porto-Novo nke mba Benin Republic na-efe agwọ dịka chi ha.
Ha na-agwọ na-ebikọ mana agwọ anaghị ata ha, ma nwoke, nwaanyị, okenye na agadi.
"Agwọ enweghị ike imerụ m ahụ, ọ bụ oke anyị ketara n’aka ndị nnanna anyị ha, ọ bụ n’ime ọdịnaala a ka a mụrụ anyị. Otu enyi m gwara m na ya chọrọ iso na-efe arụsị m, m sị ya mee ka ndị mụrụ ya buru ụzọ mara, mana nne ya jụrụ ajụ. Amụrụ m ebe a. Agwọ anaghị atụ m ụjọ chaachaa".



