Director Pink: Ọ gaghị ewepụ nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ ya ihe n'ahụ inyere ụmụnwaanyị nọ ya akụkụ aka

Aha onyonyo, Director Pink: Nwada na-ahazi ihe onyonyo egwu na-ewu ewu na Nigeria
Director Pink: Ọ gaghị ewepụ nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ ya ihe n'ahụ inyere ụmụnwaanyị nọ ya akụkụ aka
Mgbe e biputara ya

Praise Onyeagwalam bụ onye a ma ama dịka 'Director Pink' bụ onye nhazi ihe onyonyo Bekee kpọrọ 'director' a ma ama akpọkuola ụmu nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ ọbụla ha hụrụ onwe ka ha nye ụmụnwaanyị nọ n'akụkụ aka ma kwalite ha.

Director Pink ahaziela ọtụtụ ihe onyonyo egwu ndị otiegwu a na-anụ aha n'ụwa gụnyere Beautiful’ nke Phyno, ‘Abracadabra’ nke Wizkid na '10 Kilo’ nke Davido.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a,Nwada Owere ahụ kpọkuru ụmu nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ ọbụla ha hụrụ onwe ka ha nye ụmụnwaanyị nọ n'akụkụ aka ma kwalite ha.

Ọ sịrị, "Ọ bụrụ na ịbụ nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ gị, ọ gaghị ewepụ gị ihe n'ahụ inyere ụmụnwaanyị nọ gị n'akụkụ aka."

Director Pink, Onye gbara afọ 26, ehiwela ụlọ ọzụzụ ndị na-eme ihe ejide a kpọrọ 'Pinkline Academy' ma na-akwado ụmụnwaanyị n'ụzọ pụrụ iche site n'ọzụzụ nakwa nkwado ego.

Ọ sịrị, "Na abụ m nwaanyị na-eme ọfụma n'ọrụ m bụ ike akaebe na ọtụtụ ụmụnwaanyị ga-eme karịa ihe ha na-eme."

" N'ihi na ewepụla m ọgbatauhie, achọrọ m ka ụmụnwaanyị na-elere m anya, ka anyị na-etokọta ọnụ."

N'okwu etu o siri malite nka ya, Ọ sịrị, "Tupu m banye mahadum, ana m ahazi onyonyoo n’ụlọụka. Mgbe m banyere n’ogogo nke atọ na nke anọ [na mahadum] ka m nwetere igwe onyonyoo nke m."

"Ọ bụ oge ahụ ka m banyere imepụta ihe nkiri. Emeela onyonyoo maka Davido, Wizkid, Burna Boy, Phyno, Flavor. 10 Kilo nke Davido tipụtara.

"Ihe mere o jiri siere m ike imepụta egwu Davido bụ maka na ndị ọchọmma anyị chọrọ iji mee onyonyoo ahụ bụ ndị nwere ahụ.

"Ọ bụ ihe rara ahụ inweta ndị ọchọmma nwere ahụ ma bụrụkwa ndị ọ na-amasị ịpụta n’onyonyoo. Mana ihe na-atọ m ụtọ bụ na mgbe onyonyoo egwu ahụ pụtara, ọ masịrị ndị mmadụ.

"Pinkline Academy bụ ụlọakwụkwọ anyị na-akụziri ndị ntoroọbịa nakwa onye ọbụla chọrọ ịhazi oyonyoo maọbụ imepụta onyonyo".

Kirie akụkọ ya n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu: