Ihe anyị ma maka Mmesoma a sị enyi ya nwoke gburu tinye n'akpa n'Uga, Anambra State

Ebe foto si, Other
Ndị uweojii Anambra State ekwuola na ha anwụchiela nwokoroọbịa ahụ a na-ebo ebubo na o gburu ọyị ya nwaanyị ma tinye ozu ya n'ime akpa n'obodo Uga dị n'okpuruọchịchị Aguata.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ha Tochukwu Ikenga wepụtara, o kwuru na nwokoroọbịa a na-enyo enyo bụ Chima Ofoeke ka a sị na o gburu nwagbọghọ bụ Mmesoma Umeorini dị afọ iri abụọ na atọ ma bụrụ nwafọ Uga.
O kwuru na a nwụchiri Ofoeke site na mkpesa nne Mmesoma nyere n'ụlọọrụ ndị uweojii nke Umuchu na a na-achọ nwa ya nwaanyị achọ kamgbe ụbọchị 16 Ọktoba 2026.
Na nke ahụ mere ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa Agunaechemba nke Uga, Anambra State jiri nwuchie nwokoroọbịa ahụ a sị bụbu enyi nwoke Mmesoma site na kepu kepu ha nwetere.
Mgbe a na-agba ya ajụjụọnụ nke mbụ, nwaokoroọbịa ahụ kwupụtara na ọ bụ ya gburu Mmesoma maka na ọ sị na ọ chọghịzi ịbụ enyi ya nwaanyị.
O duuru ndị ọrụ nchekwa gaa n'ime ọhịa ebe o liri ozu nwata nwaanyị ahụ.
Ikenga kwuru na ugbua na Kọmishọna uweojii bụ Nnanna Oji Ama enyela iwu ka e nyefee okwu ahụ n'aka ndị ụweojii ngalaba State Criminal Investigation Department (SCID) dị n'Awka, iji mee ezi nnyocha banyere nke ya.
E liela ozu Mmesoma
Ihe onyonyo na-efesa na soshal midia gosiri ebe e dosara igbe ozu Mmesoma n'ihu ụlọ ha dị n'obodo Awarasi nke Uga.
Nne na nna, ụmụnne, ndị agbataobi na ndị obodo nọ na-ebe akwa maka etu nwada a si nwụọ n'ike.
E mechara buru ozu Mmesoma gaa lie dịka Amesi TV na soshal midia si kwuo.



























