Otu onye ebutela ọrịa Ebola n'Abuja - Minista ahụike Nigeria

Ndị ọrụ ahụike yichiri ahụ na-elete ndị bu ọrịa Ebola
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Nigeria bụ Muhammad Ali Pate ekwuola na a chọpụtala na otu onye bu ọrịa Ebola n'Abuja.

Ozi Pate wepụtara na Tuzde 20 Ọktoba kwuru na a malaitela ime nnyocha ma kwuo na ha achọpụtala mmadụ 44 e kwuru na ha na onye ahụ bu ọrịa ahụ nwere mmetụta iji hụ na-egochiri ọrịa ahụ ifesa na Nigeria.

Ali Pate kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ji ụgbọelu si mba Uganda bata Nigeria bubatara ọrịa ahụ dịka o kwuru na e dugara nwaanyị ahụ ụlọọgwụ.

E kwuru na nwaanyị ahụ nọ ebe naanị nọ ugbua.

Mịnịstrị ahụike na ụlọọrụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) kwuru na ha na ụlọọrụ ahụike FCT Health Services Secretariat nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ amalitela ịrụkọ ọrụ iji gbochie ọrịa ahụ ifesa.

Ali Pate kwukwara na Onyeisiala Bola Tinubu enyela ntụziaka ka amalitela atụmatụ igbochi mfesa ọrịa Ebola ahụ na Nigeria.

Gọọmenti Nigeria kpọrọ oku ka ndị ọrụ ahụike nakwa ụlọọgwụ na Nigeria niile gbaa gburugburu kee nkwụcha iji hụ na ha chọpụtara ma machie onye ọbụla gosiri njirimara ọrịa ebola.

Nke a na-abịa dịka mba Kenya wepụtara ozi ma kwuo na otu onye ọzọ ebutela ọrịa ahụ dịka otu onye ji ego achụ ego butere ọrịa ahụ nwụrụ oge o mere njem gaa mba DR Congo.

Kedụ ka ọrịa Ebola si efesa?

Ebola na-efesa ma ọ bụrụ na ọbara maọbụ mmiri si n'ahụ onye bu ọrịa malitegoro ịrịa ọrịa a metu onye ọzọ nakwa site n'imetu ihe ọbụla onye bu ọrịa a metụrụ aka.

Onye bu ọrịa Ebola enweghịike ifesa ọrịa ma ọ bụrụ na njirimara amalitebeghị igosi.

Gọọmenti kpọrọ oku ka onye ọbụla kee nkwọcha ma ghara ịtụ egwu.

Ha gwara ọhanaeze ka ha kwụọ aka ha nke ọma ma ghara imetu mmiri si n'ahụ onye ọbụla a na-enyo enyo na ọ bụ ọrịa ebola.

Njirimara ọrịa Ebola gụnyere oke ahụ ọkụ, ike ọgwụọgwụ, isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, nakwa afọ ọsịsa.

Ọ bụrụ na ịhụta njirimara ndị a n'ahụ gị, ọ dị mkpa ka ị gaa ụlọọgwụ ka e nyochaa gị.

Ozi ahụ kpọrọ oku ka onye ọbụla ghara ifesa ozi ụgha banyere ọrịa Ebola.