National Youth Service Corps: A kpụpụla mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị ndị NYSC n'Imo State n'ụlọikpe

Mmadụ ise a na-enyo enyo na aka ha dị na ntọrị ndị ntoroọbịa gara ife ala nna ha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị ọrụ nchekwa anwuchiela ma kpụpụ mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị ndị na-aga ime National Youth Service Corps n'ụlọikpe dị n'Owerri.

Ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) kpụpụrụ ndị a n'ihu Ọkaikpe Emeka Uzoma Orafu nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Owerri, Imo State.

DSS kwuru na ha nwuchiri ndị a na Sọnde 18 Ọktoba 2023.

Cheta ndị ntọrị tọọrọ mmadụ ruru iri abụọ nke ọtụtụ n'ime ha bụ na-aga ime NYSC n'obodo Umunoha nke okpuruọchịchị Mbaitoli n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2026.

Ndị a na-enyo enyo na ha tọọrọ ndị ntoroọbịa na-aga ife ala nna ha

Ụlọọrụ nchekwa DSS wepụtara aha ndị a dịka; Mohammed Ali dị afọ 23, Usman Aliyu dị afọ 25, Babangida Aliyu dị afọ 21, Tange Ibrahim Lili dị afọ 20 na Aminu Haliru dị afọ 27.

E boro ndị a ọnụ ebubo atọ gbadoro ụkwụ n'ịkpa nkata, ijichi mmadụ n'ike nakwa ibu ngwaagha nke iwu na-akwadoghi.

E bubo a kwuru na ndị a napụrụ ezinaụlọ ndị a nde naịra iri anọ na asatọ (N48m) and ego ndị ọzọ gbara na dọla tupu ha atọhapụ ndị ha tọọrọ.

E bokwara ha ebubo ibu egbe dịka Ak47 atọ, mgbọ egbe anọ nakwa obere egbe 'pistol' na mgbọ ya.

Mana ha niile gọrọ na aka ha adịghị n'ebubo ndị ahụ e boro ha.

Ọkaikpe Emeka Orafu bugara ikpe ahụ na Tọzde 22 Ọktoba 2026.

Ezinaụlọ ụfọdụ ndị ha tọọrọ kwuru na ha kwụrụ ụgwọ tupu ụmụaka ha enwere onwe ha mana ndị ọrụ nchekwa ekwubeghi ihe ọbụla metụtara ịkwụ ndị ntọrị ahụ ụgwọ.