Kim Jong Un: Gịnị mere akụkọ ọnwụ ya ji ewu ewu?

Kim Jong Un
    • Onye dere ya, Laura Bicker
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ahụ dị Onyeisiala North Korea bụ Kim Jong Un ezi mma dịka ọ pụtara n'ụlọntaakụkọ nke gọọmentị, na-adịghị ka onye a sị nwere ọrịa ụbụrụ ịgba ọbara.

Foto nke akwụkwọ akụkọ nke gọọmentị bụ Rodong Sinmun bipụtara gosiri onyeisiala mba North Korea ka ọ na-agagharị na-egosi ngwaahịa akwa na akpụkpọ ụkwụ, ya na nwa ya nwaanyị.

Foto ndị a na-apụta dịka otu onye China bi na mba United States na-ekwu na e bugara Kim ụlọọgwụ na Beijing, ebe ọ nọ n'ọnọdụ ọnwụ na ndụ ma mecha nwụọ.

Maka ndị ma North Korea ọfụma, ụdị kepukepu ahụ na-emelị emelị.

Mana n'obodo a na-ezokarị ihe, o siri ike hụ ịchọpụta nke bụ eziokwu, nke a na-enye ohere asịrị na-efegharị.

Asịrị pụtara ihe n'ikpeazụ a bụ nke si n'aka Wanjun Xie, bụ onye kpọrọ onwe ya onyeisioche otu 'Chinese Democratic Party' bụ otu a machiri amachi na mba China.

Xie ebuola akụkọ gụnyere akụkọ na onyeisiala mba China bụ Xi Jinping anwụọla.

Xie na-ekwu na Kim nwere nsogbu ụbụrụ ịgba ọbara, ebuga ya ụlọọgwụ dị na Beijing maka na North Korea enweghị ụlọọgwụ ga-agwọli ya.

O kwuru na ọ nwụrụ, e buchighaa ozu ya na nzuzo na North Korea, dịka ọchịchị ya ka na-ezo n'ozi ọnwụ ya.

Mana foto na-ekwu ihe ọzọ. O nweghị ụzọ.

Dịka e nweghị ụzọ a ga-amata kpọmkwem oge e sere, e nwere ihe ndị ọzọ ga-eme mmadụ ịrụ ụka maka ebuno ahụ,

Kim Jong Un

A ga-enwe ihe ga-egosi na Kim nwere nsogbu ahụike na mberede ma gafee okeala North Korea.

China ga-agbachisị nchekwa n'okeala ha iji gbochie ndị na-agba ọsọ ndụ ịbata.

Ụghara ga-arị elu n'ụlọnnọchiteanya North Korea niile .

Ndị gbagara South Korea na-enwetakarị ozi site n'okeala China.

O nwebeghị nke mere n'ihe ndị a.

Ndị uweojii nzuzo gwara Yonhap na o nweghị ihe ha nụrụ yiri ya.

Kepukepu ahụ dịkwa ka iti mkpu oge o nweghị onye na-achụ gị.

N'afọ 2020, otu onye North Korea gbagara South Korea kwuru na ya nwere owuwe anya pasent 99 na Kim nwụrụ ka a wachara ya ahụ maka nsogbu ọrịa obi.

Kim pụtara n'ọha, asịrị kụsaa.

Ndị ezinaụlọ Kim achịala North Korea ugboro atọ mana ihe ga-eme ma Kim Jong Un chịcha bụ ihe edochaghị anya dịka nke ndị bu ya ụzọ si doo anya.

Kim Il Sung tinyere ọtụtụ afọ ịkwado nwa ya nwoke bụ Kim Jong Il, maka ọchịchị. Oge Kim Il Sung nwụrụ n'afọ 1994, atụmatụ onye ga-ewere ọkwa doro anya, Kim Jong 11 gara siriri werere.

Ọrịrị Kim Jong Un mere ọsịsọ, ma ihe na-adịghị akwụ otu ebe .

Ka Kim Jong Il nwere ọrịa mkpọnwụahụ n'afọ 2008, e buliri ọdụdụ nwa ya nwoke n'ọkwa aghara aghara.

Tupu nna ya anwụọ n'afọ 2011, a marala ya dịka onye ndu n'ọdịnihu.

N'agbanyeghị nke a, Kim Jong Un jichiri ikike ọchịchị site na ikpochapụ ndị iro ya na ndị o chere aka mgba.

Taa, ụlọọrụ ndị uweojii nzuzo nke mba South Korea nwere nkwenye na Kim Jong Un na-akwado nwa ya nwaanyị ịnọchi ya. Ọ pụtala na mmemme nwere ụda nakwa ngosi ndịagha.

Mana e chere na ọ dị naanị afọ 13. Nwaanyị achịbeghị North Korea , a kpọpụtabeghị aha ya dịka onye ga-anochi ya. Na ọ bụ onye na-eto eto pụtara na ọ ga-aghọ mgbọ n'ọgụ onye nwere ikike.

Ihe ndị a niile bụ ihe na-arụtụ aka ihe mere ọtụtụ ji etinye uche na kepukepu gbasara ọnọdụ ahụike Kim.

Ihe ọzọ asịrị ahụ ji dị ire bụ na Kim buru oke ibu ma bụrụ onye na-ese sịga nke ukwuu.

Ụlọọrụ uweojii nzuzo nke mba South Korea adọọla aka na ntị ugboro ụgboro sị na ụdị ndụ ọ na-ebi nwere ike ibutere ya ọrịa obi.. na ọrịa mkpọnwụ ahụ dị n'ezinaụlọ Kim.

O nwee ihe mere Kim, nsogbu ga-adapụtara obodo ndị ha na North Korea gbara agbata obi nakwa mba ụwa.

Onye ọbụla banyere ọkwa ọchịchị na ntụmadị ga-akpalite okwu onye nwere ikike ịchịkwa ngwaagha nuklia nke North Korea nakwa ọchịchị obodo.