Enugu State College of Education ọ manyere ụmụakwụkwọ ibite ego Nelfund maọbu ha hapụ isonye ule?

ESCET
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọakwụkwọ Enugu State College Education Technical (ESCET) agọọla na ha etinyeghi iwu na ụmuakwụkwọ ga-ebite ego gọọmentị Etiti bụ Nigerian Education Loan Fund (NELFUND) maka agụmaakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ dọrọ ụlọakwụkwọ ahụ ka igwe na-enye ọkụ mgbe akụkọ fegharịrị na soshal midia na-ebo ebubo na ụlọakwụkwọ ahụ manyere ụmụakwụkwọ ochie na ndị ọhụrụ ịnata ego mbite Nelfund.

Ọnụ na-ekwuru ESCET bụ Chinwe Ani gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụghị eziokwu na ụlọakwụkwọ ahụ manyere ụmụakwụkwọ ibite ego Nelfund.

Ọ sịrị, "O nweghi onye ọbụla manyere onye ọbụla ịnata ego Nelfund."

Mana o kwuru na ha na-aja ụmụakwụkwọ ume ka ha nata ego mbite ahụ.

"Ọ bụrụ na i nwere ego ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ọ bụghị iwu. Ọ bụ maka ụmụakwụkwọ agaghị akwụli ụgwọ akwụkwọ."

"Ọ bụ mbite nke mmadụ enweghị mkpa iji ihe ọ ga-eji akwụ."

"O nweghị onye na-amanye onye ọbụla."

Ihe akụkọ na-efegharị kwuru

Akụkọ kwuru na a manyere ụmụakwụkwọ ESCET itinye akwụkwọ maka ịnata ego mbite NELFUND ,e meghị etu ahụ, ha gaghị eso mee ule.

Akụkọ ahụ rụtụrụ aka n'ozi nke Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Patrick A. Aneke zipụrụ nke kwuru na: "Nke a bụ iji mee ka ụmụakwụkwọ mata na ọ bụ iwu na nwataakwụkwọ ọbụla (NCE na Degree) ga-edenye aha ma nata ego mbite Nigeria Education Loan Fund (NELFund)."

Akụkọ ahụ kwuru na ụmụakwụkwọ anabatataghị ntuziaka dika ụfọdụ kwuru na ndị mụrụ ha achọghị ya.

Ebubo e boro gụnyere na onyeisi na-ahụ maka ụmuakwụkwọ (Dean of Students Affairs) bụ Dr. Bertrand Ekwe, kwuru n'ezie na akwụkwọ gosiri na mmadụ tinyere akwụwkọ maka ịnata ego mbite NELFUND dị mkpa maka itozu ime ule.

Ihe Gọọmentị Enugu State kwuru

Ọkammụta Ndubueze Mbah

Onyeisi ahụ dọrọ ụmụakwụkwọ aka na ntị sị ha akụla ndị ọzọ mba n'ịnata ego mbite Nelfund, sị "Anyị na-akwado Gọọmentị State ebe, ị gaa n'ihu, aga m ewepụ gị."

Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ steeti ahụ bụ ọkammụta Ndubueze Mba azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị nakwa Whatsapps oge akụkọ a pụtara.