Ndị Alberta 'ekwuola hoohaa' na ha achọghị isi na Canada pụọ - Praịm Minista Mark Carney

Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Mark Carney
Nkọwa foto, Mark Carney
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Dịka a na-eche mpụtara ntuliaka 'referendum' nke ndị Alberta mere na mba Canada, ndekọ na-egosi na ọ dịka ndị Alberta achọghị isi na mba Canada pụọ maọbụ nwere onwe ha.

Mana Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Mark Carney kọwara ụbọchị e mere ntuliaka nwereonwe na mba ahụ dịka 'nnukwu ụbọchị'.

Carney bụkwa nwaafọ Alberta kwuru na ndị mba ha kwadoro "ịdị n'otu… ilekọta onwe anyị" dịka ụmụ amaala mba Canada.

O kwuru nke a dịka a na-agụkọ vootu a tụrụ ma kelee ndị niile tụrụ vootu na ntuliaka ahụ ma ndị kwadoro ma ndị na-akwadoghị nwereonwe Alberta.

Ndekọ na-egosi na ọ bụ ihe ruru 75% ndị tụrụ vootu nwereonwe ahụ kwadoro ka Alberta nọrọ na Canada mana a ka na-agụkọ vootu.

Mmadụ ruru otu nde na ụma (1,407,592) kwadoro ka Alberta nọrọ na Canada.

N'aka nke ọzọ, mmadụ karịrị narị anọ (456,588) tụnyere ka e mee nke Bekee kpọrọ 'referendum' dịka a ka na-agụkọ vootu.

Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua na gọọmenti ga-abịakọta ọnụ wepụta usoro ọchịchị ga-abara ndị Canada niile uru.

Nkenke awa fọrọ ka a kpọpụta mpụtara ntuliaka nnwereonwe ndị Alberta isi na mba Canada pụọ

Ndị na-azọ nwereonwe Alberta bụ otu mpaghara mba Canada

Ndị Alberta dị na mba Canada na-eme ntuliaka Bekee kpọrọ 'referendum' ịmara na ha aga-anọ na mba Canada maọbụ na ha aga-apụ na mba ahụ.

Ntuliaka ahụ na-aga n'ihu ugbua na mba Canada mana mgbe na-adịghị anya ka mpụtara ya ga-apụta.

Ndị ọchịchị Alberta kwuru na mmadụ nde ise na ọkara '(5.5 million)' bụ ndị toruru ogo ịtụ vootu ahụ.

Ihe ọzọ ha kwuru bụ na ọ bụ ajụjụ iri ka ndị ahụ na-atụ vootu ga-enye ọsịsa ya mgbe ha na-ebinye aka.

Ụfọdụ ajụjụ 10 ndị ahụ gụnyere

Ihe ndị na-akatọ nwereonwe Alberta

E wepụ ajụjụ ịmara na ndị Alberta a ga-anọ na mba Canaba maọbụ na ha achọrọ ịpụ, ha na-ebinyekwa aka n' ajụjụ ndị ọzọ.

A chọrọ ịma na ndị Alberta aga-ebido usoro nnwereonwe "referendum" si na Canada pụọ, ihe gbasara ọpụpụ na mbata ndị mbiarambịara n'ime mba Canada, nakwa ihe ndị ọzọ gbadoro ụkwụ na mmekọ ha na Canada.

Mana ugbua ihe a na-ahụ na ntuliaka nnwereonwe ahụ dị etu a:

  • Ị chọrọ ka Alberta soro na mpaghara mba Canada? Ndị chọrọ dị 1,107,558), ndị na-achọghị dị 346, 261.
  • Ị kwadoro ka ikike Gọọmenti Alberta nwere banyere ndị mbịarambịara na gburugburu ha gbalite? Ndị kwere (405,648); mana ndị na-ekweghị (299,946)
  • Ị kwadoro iwu kwuru na ọ bụ naanị ụmụamaala mba Canada ga-erite elele ihe ụfọdụ e ji-ebi ndụ? Ndị kwere dị 399, 675 - Ndị na-ekweteghị dị 267,770
  • I kweretara ka e tinyere ndị Alberta njirimara ntuliaka ya bụ 'Voter ID'? Ndị kwere: 202,367, ndị na-ewkeghị:30, 494.
  • I kwere ka gọọmenti Alberta na Gọọmenti mpaghara ndị ọzọ na Canada jikọọ aka ọnụ gbanwe iwu mba Canada? Ndị kwere :141, 296, ndị na-ekweghị :137,697
  • I kwetara ka Alberta na Gọọmenti ndị ọzọ jikọọ aka ọnụ mee iwu ga-eme ka mpaghara dị iche iche chọrọ isi na mba Canada pụọ nwee ike ịpụ? Ndị kwere: 117,128, ndị na-ekweteghị: 123,052.

Mara na anyị ka na-eche mpụtara na ntuliaka nnwereonwe ahụ niile dịka ndị nhazị ya ga-agụpụta etu okwe si gbaa kpọmkwem.