Inec agbanweela ndekọ aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2027

Ebe foto si, INEC Nigeria/Facebook
Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) agbanweela ndekọ aha nke ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na state dị iche iche na ntuliaka ọha nke afọ 2027.
N'ozi ọnụ na-ekwuru Inec bụ Mohammed Haruna wepụtara n'ụbọchị Tọzde 29 Ọktoba 2026, ka ha kwuru na ha etinyela aha ụfọdụ ndị ha wepụrụ n'akwụkwọ ndekọ aha ikpeazụ nke ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na state dị iche iche bụ nke ha wepụtara na abalị 10 Ọktoba 2026.
Ha gara n'ihu kọwaa na ha mere mgbanwe ndị ahụ mgbe ha tụlechara mkpesa metụtara mwepụ aha, ntinye aha na-ekwesịghị ekwesị, nakwa mkpesa banyere ndị a họpụtara karịa otu ugboro ka ha zọọ ọkwa.
Haruna kwuru na ụlọọrụ ahụ etinyela aha ndị e kwesịrị itinye na mbụ mana ma wepụkwa aha ndị e tinyere n'ụzọ na-ekwesịghị ekwesị maọbụ ndị nhọpụta ha megidere iwu ntuliaka Nigeria.
N'ihe gbasara ntuliaka gọvanọ, Inec kwuru na ọ natara mkpesa ruru 69 sitere n'aka otu ndọrọndọrọ ọchịchị 12 n'ime steeti 26.
Mana nkọwa ha kwuru na ụlọọrụ ahụ kwadoro mkpesa 41, ma jụkwa mkpesa 28 ndị ọzọ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ ndị a ma ama nke a metụtara?
Ndị a na-atu anya na mwepụ na ntinye aha ọhụrụ a metụtara bu Ọkammụta Isa Pantami ji ọkọlọta otu ndọrọ ndọrọ Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa gọvanọ na Gombe state na Oladipupo Adebutu jikwa ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa gọvanọ Ogun steeti.
Onye ọzọ bụ Aminu Gwarzo bụ onye ga-eji ọkọlọtọ pati Nigeria Democractic Congress (NDC), azọ ọkwa gọvanọ na Kano steeti.
Ka ọ dị ugbu a, BBC News Igbo enwebeghị ike ime nnyocha nke aka ya iji chọpụta ma aha ndị a abanyela n'akwụkwọ ndekọ aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na state ha dịka ụlọọrụ Inec siri kwuo.
Mana akụkọ ụlọ mgbasaozi mpaghara wepụtara na-ebo ebubo na aha Oladipupo Adebutu nakwa Aminu Gwarzo adịghị n'akwụkwọ ndekọ aha nke ọhụrụ ụlọọrụ Inec wepụtara.
Ntuliaka ndị omeiwu state
Maka ntuliaka ndị ga-azọ ọkwa ndị omeiwu steeti, Inec kwuru na otu ndọrọndọrọ ọchịchị tinyere mkpesa 61 n'ime steeti iri na otu.
Mana ụlọọrụ Inec kwuru na ya akwadola mkpesa 25 n'ime ha, ma jụkwa mkpesa 36 ndị ọzọ.
Inec kwukwara na ya e tinyela mgbanwe ndị ahụ na webụsaịtị ya.
O kwere nkwa na ya na-agba mbọ ịhụ na ntuliaka afọ 2027 ga-abụ nke ziri ezi na nke a ga-atụkwasị obi.




























