Ihe i kwesịrị ịma maka egwuregwu Dakar 2026 Youth Olympics

Ebe foto si, AFP via Getty Images
- Onye dere ya, Emmanuel Akindubuwa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
N'ụbọchị Satọde 31 Ọktoba a ga-eweli mgbanaka egwuregwu Olympic n'oge mbụ a na-achịkọba ya n'Africa dịka mba Senegal ga-achịkọba egwuregwu Youth Olympic Games.
Obodo Dakar, Diamniadio na Saly ka a ga-anọ hazie egwuregwu a ga-enwe abalị 15 ga-abịa na njedebe na 13 Nọvemba.
Ihe ruru ndị egwuregwu 2,700 ga-esonye n'egwuregwu 25 na mmemme nwere ihe nrita 153.
A ga-enwekwa egwuregwu nke na-agaghị enwe ihe nrita dị na ya.
Gịnị bụ egwuregwu Youth Olympics?
Egwuregwu a ọ bụ otu International Olympic Committee (IOC) na-ahazi, bụ egwuregwu pụrụiche nwere ọtụtụ egwuregwu na ya nke bụ maka ndị ntorobịa dị afọ 15 ruo 17.
Ebumnobi ya abụghị naanị ịkwalite mmụọ ndị ntorobịa kama na ọ bụ ịkwalite nkwenye egwuregwu Olympic ma mee ka ndị ntorobịa hụta egwuregwu dịka ihe na-akawlite udo na ịdịnotu.
Oge mbụ e mere ya bụ n'afọ 2010 na mba Singapore. Egwuregwu Youth Olympi nwere ọtụtụ egwuregwu ndị okenye nakwa ndị ọhụrụ nke ụmụnwaanyị na ụmụnwoke na-esonye na ya.
Nanjing dị na mba China bụ ebe e mere agba nke abụọ ya na 2014 ebe agba nke atọ ya bụ bụ Buenos Aire isiobodo mba Argentina ka e mere ya ka afọ anọ gasịrị.
Dakar kwsịrị ịchịkọba egwuregwu a n'afọ 2022 mana ọrị Covid-19 mere ka e yigharịa ya.
Kemgbe a malitere ya, ọtụtụ ndị egwuregwu eritela ọtụtụ ọla dị iche iche na ya.
Chad Le Clos mba South Africa na-egwu mmiri na Jade Jone mba UK na-eme taekwondo sonyere n'agba nke mbụ ya e mere na Singapore ma gaa n'ihu turu ugo n'egwuregwu Olympics n'afọ abụọ na-esote ya na London na 2012.
Noah Lyles mba America ritere ọlaedo na Nanjing n'afọ 12 gara aga tupu o rita ọlaedo n'egwuregwu Olympics na Paris na 2024.
Gịnị mere o ji dị mkpa nye Africa?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mba Senegal ịhazi egwuregwu Olympics bụ oke ihe nye Africa dịka Christophe Dubi bụ onye ọrụ IOC si kwuo.
"Africa ahaziela ọtụtụ egwuregwu dị iche iche mana nke a bụ oge mbụ Africa na-achịkọba ihe ọbụla gbasara Olympic," ka ọ gwara BBC.
Thierno Cisee bụ osote onyeisi Local Organising Committee (LOC), kwuru na ọ bụ oke ihe nye ndị mba ahụ niile.
"Anyị ma na anyị ga-abụ ndị nnọchiteanya nye Africa niile," ka o kwuru.
"Ọ dị mkpa ka anyị nọchite anya Africa nke ọma ma gosi ụwa niile na anyị zuru ka emee."
Kirsty Coventry si mba Zimbabwe bụụrụ nwaanyị mbụ n'ụwa niile nakwa n'Africa a họpụtara dịka onyeisi IOC n'afọ gara aga. Ọ nọọrọ dịka onyeisioche na-ahụ maka nhazi maka Dakar 2026.
Enweghị ọrụ nye ndị ntorobịa bụkwa ihe ọzọ Africa na-agabiga.
Ụfọdụ ndị ụmụafọ mba Senegal na-enwe obi abụọ, ebe ndị na-ahazi egwuregwu a nwere olileanya na egwuregwu a ga-enye ha ohere irite uru dị na ya site n'ọrụ, nlegharịanya nakwa ihe ndị ọzọ.
Ihe ruru ndị ntorobịa 400 si Africa, enwetela ọzụzụ na teknụzụ nakwa ihe dị iche iche banyere egwuregwu a.
Dubi kwuru na nnukwu uru dị na ya nye Africa ma kọwaa na egwuregwu bụ ụzọ a ga-esi nweta mgbanwe n'Africa.
Kedụ egwuregwu a ga-eme na Youth Olympics?

Ebe foto si, Getty Images
Egwuregwu 19 n'ime egwuregwu 25 gụnyere ịgba ọsọ, igwummiri nakwa egwuregwu ndị ọzọ na-amasị ndị ntorobịa dịma breaking na skateboarding bụ ndị e mere na Paris Olympic na 2014.
Bọọlụaka Beach, mgba beach, futsal, Baseball5 na Wushu Taolu bụ egwuregwu ọhụrụ a na-eme na Youth Olympic.
Golf, ịgba karate na surfing so n'egwuregwu iri a na-eme iji kwalite mmasị ndị obodo.
E nwere ọtụtụ egwuregwu ndị ọzọ dị iche iche.
Kedụ ebe ọ ga-akpọtụ?

Ebe foto si, Getty Images
Kama ịrụ ama egwuregwu ọhụrụ, ndị na-ahazi ya kwuru na ha rụgharịrị ụfọdọ ama egwuregwu iji hụ na ọ baara ndị obodo uru na e mechaa egwuregwu ahụ.
Dakar ga-anabata ndị na-agba ọsọ, rugby sevens na futsal n'ama egwuregwu Iba Mar Diop complex ebe egwuregwu igwummiri, bọọlụ nkata 3x3, breaking, skateboarding na Baseball5 ga-akpọtụ na waterfront Tour de l'Oeuf complex.
Ama egwuregwu Diamniadio nke a na-arụ ọhụrụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Dakar bụ isi nhazi egwuregwu ahụ.
Ama egwuregwu Abdoulaye Wade stadium ka a ga-anọ mee emume mmalite egwuregwu ahụ ma mee egwuregwu archery ebe a ga-eme badminton na Dakar Arena.
Dakar Expo Centre ka a ga-eme gymnastics, fencing, tennis tebulu, judo na Wushu Taolu.
Omenala dị n'egwuregwu a

Ebe foto si, Getty Images

































