Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Onye Naịjirịa ekperela azụ n'ọsọ skeleton na South Korea
Nwaafọ Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo ekperela azụ n'ọsọ nkwado skeleton nke wịnta olimpiks a na-eme na South Korea.
Adeagbo kpetere azụ n'ọsọ nkwado abụọ agbara n'asọmpi skeleton ụbọchị Fraide.
O ji ihe karịrị ntabianya abụọ na ọkara ghara ịgbada ugwu n'elu efere igwe karịa onye gbakarịchara ọsọ na nkwado ahụ bụ Lizzy Yarnold, onye Britain.
Yarnold gbazuru nke ya n'ime ntabianya 51.66.
Mana Adeagbo - onye Naịjirịa nke mbụ n' asọmpi na wịnta olimpiks - anaghị ekwe ya kpasuo ya iwe.
Nick Hope bụ onye BBC dere n'igwe okwu Twitter:
Hope kwukwara na onwetere nkwado si n'ụlọ nke si n'aka ndị Naịjirịa ibe ya so asọmpi.