Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Watford vs Arsenal: Ihe a ọ bụ ụkwụ nnama ji aga Aba?
Asọmpi Watford na Arsenal taa agbaghị aka ebe ọnwụ gbuoro Arsenal ka a rụrụ aka.
Ngwa ngwa a malitechara bọọlụ, na nkeji iri, ka nwaamadị Arsenal ji eme ọnụ bụ Pierre-Emerick Aubameyang, sọkanyere goolu mechara bụrụ naanị aka ahịa a gbara n'egwuregwu a.
Ochegoolu ndị Watford bụ Ben Foster ji aka ya doziere Aubameyang nri chinyere a ka ọ nọ na-egbu oge ịnara bọọlụ a gbaalara ya azụ, mere ka Aubameyang fere ka egbe fekpuo ya na mpio.
Na-erughi otu nkeji e mewachara ndị Watford obi, Troy Deeney nke Watford ejiri aka ya ritere onwe ya mpempe akwụ uhie ka o ji aka kpọọ Lucas Torreira n'ihu, mere ka a chụpụ ya n'ọgbọegwuregwu.
Nchụpụ a mere ka Watford nwee naanị mmadụ iri n'ọgbọegwuregwu ahụ, nke belatara ike ha.
Watford gbara Arsenal jaajaa, mana taa abụghị ụbọchị ha.
Mana mmeri a Arsenal meriri nwereike inye ha ohere ịma ma ha a ga-eso zọọ "egwu ndị ọ kara obi" ga-eso agba asọmpi Champions League nke afọ na-abịa.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmeri a