Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Valencia v Chelsea: Valencia amụwala Chelsea anya ka azụ
Ihe otu Chelsea tụrụ anya emeghiri ha n'abalị Wenzde dịka ha na otu Valencia gbara onwe ha onye laba onye laba.
Ọkpụ goolu abụọ nke Valencia ji nweta nhatanha bụ ihe tụrụ ndị Chelsea na-anya.
Carlos Soler bu ụzọ nye goolu mbụ n'asọmpị ahụ na nkeji 40.
Kovacic nke Chelsea sara goolu ahụ Soler nyere na nkeji 41 n'agba nke mbụ.
Ogbo ya bụ Pulisic so kwa ya n'azụ na nkeji 50 mgbe o nyere goolu nke ya.
Chelsea bidoro ịgba mbọ jide ka ha ji rue ngwụcha asọmpị ahụ mana nke ahụ emeghị.
Ọ fọrọ obere ihe ka ogbu opi gbuo opi ya na nkeji 82 mgbe Wass nke Valencia nyere goolu ya.
Rodrigo Moreno majara Chelsea na nkeji 96 dịka ọ fọrọ obere ihe ka o nye goolu mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Onye laba onye laba a ha gbara onwe ha pụtara na o nweghi onye n'ime ha ga-agaru agba nke ọzọ.
Chelsea ga-ezutekwa Lille n'izuụka abụọ na-abịa ebe Valencia ga-ezute Ajax.
Lee ihe otu Chelsea kwuru maka asọmpị a