Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ụmụ Naịjirịa ruru 753 chọrọ isi mba Ghana lọghachi
Dịka okwu mmekpa ahụ a na-emekpa ụmụ Naijirịa bi na mba Ghana ka na-arị elu, ụmụ Naijirịa ruru narị asaa na iri ise na atọ ekwuola na ha chọrọ isi Ghana lọghachi.
Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere n'ụbọchị Mọnde.
Dabiri-Erewa kwuru na ndị Mịnịsta atọ ya bụ ihe gbasara na-atule etu ha ga-esi gaa kpọlata ndị ahụ chọrọ ịlọghachi ma marakwanụ etu gọọmentị ga-esi nyere ha aka.
O kwuru sị: "Mmadụ narị asaa na iri ise na atọ bụ ndị binyere aka n'akwụkwọ ma kwuo na ha chọrọ ịlọghachi."
"Ndị Mịnịsta atọ okwu a gbasara enweela mkparịtaụka ugboro ugboro iji mata ihe ọzọ a ga-eme."
"Ugbua ndị a kwuru na ha chọrọ ịlọghachi obodo ha, nsogbu adịghị ya. Ha bụ ndị Naịjirịa, obi dị anyị ụtọ na ha chọrọ ịlọghachi, mana ọ dịghị mma ka ha lọghachi na-enweghị ihe ọbụla anyị kwadooro ha."
Dabiri-Erewa kwukwara na ọ bụghị maka okeala Naịjirịa nke gọọmentị etiti kpọchiri kpatara ụdị agwa gọọmentị Ghana na-akpa.
O kwuru na o teela ya bụ okwu malitere, nke onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akfuo-Addo tinyere ọnụ na ya.
Mana ya bụ okwu ka na-enye nsogbu ruo taa.
Olileanya Inglandi nwere iru agba nke ikpeazụ na Uefa Nation's Lig akpụọla afọ n'ala
N'egwuregwu, n'Uefa Natons League agbara ụnyaahụ, ji ọkpụ goolu abụọ Merie England.
Nke a pụtara na-olileanya ndị England nwere iwu n'agba nke ikpeazụ egwurrgwu ahụ akpụọla afọ n'ala.
Ndị Inglandị gbaliri ike ha ịnye goolu maka ya bụ ike ha amịtaghị mkpụrụ.
Inglandi gbatara ndị nke atọ n'afọ 2019.
Ụgbọ njem urukpuru abụghị nke ndị gọọmentị amalitela njem urukpuru
N'ofesi, mmadụ anọ si mba Amerịka na Japan amapụla njem nchọta na urukpuru bụ nke ha ji ụgbọelu ndị Space X mee.
Gịnị ka ha na-achọ ebe ahụ? Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka urukpuru nke Amerịka bụ NASA sị na o ruola mgbe ụgbọelu njem urukpuru nke ndị na-achụ ntaego ga-amalitezị ịna aga n'urukpuru.
Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkwọ mahadum teknụzụ na Kaduna steeti ebe ha tọọrọ mmadụ atọ
Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkọ mahadum teknụzụ dị na Kaduna steeti bụ ebe ha gbara otu onye egbe ma tọrọ mmadụ atọ.
Onye kwuru nke a bụ Mohammed Jalige bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ onye kwuru na ndị ajọ mmadụ a wakporo mahadum a n'abalị Satọde.
Unu asaala chi ee! Taa bụ Orie ga-ewetere anyị ihe ọma. Ndụ mmiri ndụ azụ. Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị
Ka chi fo
Gbaanụ mbọ soro anyị echi maka akụkọ ndị dị mkpa na-ewu n'ogbe gị.
Gọvanọ Anambra steeti amanyela ụbọchị ezumike maka Nnamdi Azikiwe
N'ozi ha ziputere, Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha-ekewapụtala otu ụbọchị dịka ụbọchị ezumike iji cheta ma kwanyere Nnamdi Azikiwe ugwu.
Ụbọchị ahụ ahọpụtara bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.
Ndị bu egbe egbuola mmadụ 34 n'Itiopia
Ndị omekome bu egbe agbabupla ihe ruru mmadụ iri atọ na anọ na ọdịda anyanwụ Itiopia mgbe ha wakporo out ụgbọala njem n’ebe ahụ.
Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru onye na mba ahụ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ ka nwereike ịnwụ na mwakpo ahụ mere na mgbede ụbọchị satọde.
Ka chi fonu!
Ọ bịara ije nwe ụna! Ka ọ dịnụ echi.
Igbos: Ọchịchị 2023 akpalitela aha ndị Igbo na Twitter ọzọ, Ihe ndị mmadụ na-ekwu mere 'Igbos' ji malite iwu na soshal midia
Dịka afọ 2023 na-abịa nso nso, ọtụtụ nkata gbasara ọchịchị Naịjirịa n'afọ ahụ na-apụta.
Nke dapụtara taa metụtara ndị Igbo mekwara ka ha wuo ewu na soshal midia.
Ọ malitere mgbe otu onye bụ Hayatu kwuru na otu APC na PDP agaghị enye ndị Igbo ohere ịzọ ọkwa onyeisiala na otu ha.
Okwu ya kpalitere mmụọ ndị ọzọ nke mere na ụfọdụ mmadụ katọrọ ya na-ekwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị.
Otu onye akpọrọ Dokun Ojomo pụtakwara rịọ ka ndị Igbo gbaghara ya ma kwuo na ndị Igbo agbalịala otu PDP hoo haa.
Afam Deluxo bụ onye a ma ama kwukwara na ọ bụrụ na ha arịọghị mgbaghara na ọ ga-esi imi n'ala hụ na ndị Igbo atụnyeghịrị Atiku na ntụliaka afọ 2023 na-abịa.
Kedụ ihe bụ uche gị maka okwu a a na-ese?
Ndị Israel gburu otu onyeisi ndị Al-Qaeda
N'Ofesi ndị nta akụkọ Reuters ekpuheela na ndị ọrụ nchekwa nzuzo mba Israel egbuola ọnyeisi nke abụọ ndị otu Al Qaeda na mba Iran.
Ha gbagburu Abdullah Ahemed Abdullah n'ụbọchị asaa nke ọnwa ọgụst.
Abdullah bụ onye kpara nkata ogbunigwe gbara n'ụlọ nnọchịte mba Amerịka ndị dị n'afrịka n'afọ 1998.
Agbagburu Abdullah bụ onye eji Abu Muhammad al-Masri mara na nwa ya nwaanyị bụ nwunye nwa Osama Bin Laden bụbu onyeisi otu ahụ.
Ndị mba Iran na-ekwu na akụkọ a abụghị eziokwu n'ihi na enweghị otu Al Qaeda na mba ha.
Ekpuheela ụgbọala ji ọku latrịka agba na Legọs steeti
Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekpuheela ụgbọala mbụ arụrụ na Naijirịa nke na-eji ọkụ latrịk agba.
Ọ bụ ndị ụlọọrụ Satllions Automobile rụrụ ya bụ ụgbọala nke agha ya bụ Hyundai Kona.
Dịka Sanwo-Olu na-ekpuhe ya ka o kwuru na gọọmentị Legọs steeti ga-arụ ebe ndị mmadụ a ga-aga tinye latrịk na ya bụ ụgbọala.
N'otu aka ahụ ka Sanwo-Olu ji ohere a kwe ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ya dị njikere ịrụcha okporo ụzo nke Legọs-Ibadọn ma banye kwa n'agba nke abụo nke ụzọ Aradagun Imeke.
Mmadụ 156 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa
Ngalaba NCDC edepụtala na ọnụ ọgụgụ ndị buterela Coronavirus na Naijirịa kamgbe o bidoro nọzị na puku iri isii na anọ, narị asatọ na iri asatọ na anọ.
Ndepụta ọhụrụ ha depụtara gosiri na otu onye ọzọ anwụọla sịta n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ otu narị na iri anọ na isii ọzọ agbakeela ebe otu onye ọzọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa.
Ị bọọla chị!
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Ụmụ Naijiria 32 mba Germany chụrụ alọtaala
Ụmụ NAijiria 32 mba Jamanị gbara ụgbọ nwa mkpi alọtala na Naijiria ụbọchị Fraide.
Otu onye ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ gwara ndị ntakụkọ na ọ bụ ụgbọelu 'EnvelopeAirlines' bulatara ha n'ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed Airport dị na Legos.
Naijiria ga-agbazite ego dị nde dọla 750 n'aka 'World Bank'
Gọọmenti Etiti na-achọ ịgbazitere ego dị nde dọla narị iri asaa na iri ise n'aka ụlọakụ mbaụwa Bekee kpọrọ 'World Bank'.
Mịnịsta na-ahụ maka ego na Bọjeti bụ Zainab Ahmed bụ onye gbara ama ụbọchị Fraide n'Abuja n'emume nhibe kọmịtị na-agba mbọ maka gbapụta na nsogbu Covid-19 dọbara akụnaụba Naijiria.
Ahmed kwuru na ego mgbazite ahụ bụ iji kwalite akụnaụba Naijiria nke Covid-19 kụpịara.
“Niajiria dịka omba kachasị n'Afrịka agaghị arịanwụ ịtọ n'ọtanisi; ịzọta ndụ mmadụ dị nde narị abụọ bụ mgbado ụkwụ ihe anyị na-ekwu."
Buhari ebinyeela aka akwụkwọ maka ụlọakụ
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu ọhụ nke nke a ga-eji hiwe ụlọikpe pụrụ iche maka ikpe metụtara ego nakwa ụlọakụ nke a kpọrọ 'Banks and Other Financial Institutions Act 2020' na Bekee.
Dịka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu siri kọwaa, iwu a bụ nhazigharị iwu nke dịbụ mbụ iji were gboo mkpa ndị dapụtara n' ihe gbasara ụlọakụ na ihe so ya n'afọ iri abụọ gara aga.
INEC sị ha ga-emegharị ntuliaka ndị fọrọ afọ n'ụbọchị ise ọnwa Disemba
Ụlọọrụ Inec ekwuola na ha ga-emegharị ntuliaka iri na ise fọrọ afọ na Naịjirịa n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2020.
Nke a dị n'ozi onye ọrụ ha na-ahụ maka nkuzi usoro ntuliaka bụ Festus Okoye deegara ụlọọrụ ntaakụkọ 'Leadership' na Fraịde.
Cheta na ụlọọrụ a kagburu ụbọchị ha kwesịrị ime ntuliaka ndị a maka ọgbaghara dapụtara na Naịjirịa mana site na nzuko ndịisi ha nwere ka e ji hiwe ya.
Okoye sị na ụlọọrụ Inec kelere ndị gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa, otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ndị Naịjirịa maka nkwado e nyere ha.
Ha rịọkwara ndị mmadụ ka ha kwanyere onwe ha ugwu dịka a na-eme ntuliaka ndị a fọrọ afọ.
Lee nụ etu Super Eagles si kwọọ aka tiere ndị Sierra Leone akị
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa ji gara agara bata n'asọmpi ha ndị Sierra Leone gbara taa mana Sierra Leone gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola.
Asọmpi a biri n'ọkpụ goolu anọ anọ nke otu egwuregwu abụọ ndị a nyeritara onwe ha.
N'ụzọ ụtụtụ nkeji 4' ka Alex Iwobi ji inye goolu gbapere ọnụụzọ neetị ndị Sierra Leone.
Victor Osimhem sochiri ya azụ mgbe o nyere goolu na nkeji 21', ebe Alex Iwobi nyekwara goolu ọzọ na nkeji 27'.
Goolu zokwara ka mmiri ọzọ, mgbe Samuel Chukwueze mezuru ya goolu anọ nke Naịjirịa na-enye n'ime nkeji 29'.
Super Eagles chere na ụka ebiela mana ndị Sierra Leone gwara ha na e jighi ụtụtụ ama njọ ahịa ka ha malitere ịsa goolu ndị a na nkeji 41' site n'aka Kwame Quee.
Ka Super Eagles ka na-agba ọnyụpa ọnyụpa, ndị Sierra Leone sara goolu atọ fọrọ afọ nkeji 72', 80' na 86' site n'aka Al-Hadji Kamara, Mustapha Bundu na Al-Hadji Kamara ọzọ.
Nke a mere pụtara na ụzọ ka dị anya ka Naịjirịa itozu oke n'asọmpi Iko Mba Afrịka afọ 2021.
Naịjirịa ga-ezute Sierra Leone ọzọ n'ọgbọegwuregwu Siaka Stevens dị na Freetown n'ụbọchị 17 ọnwa Nọvemba, afọ 2020.