"Ụlọ anyị kuturu abụghị ụlọọgwụ kama ọ bụ ụlọ a gbahapụrụ ndị omekaome bizi"
Odeakwụkwọ mgbasaozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Ogwuwike Nwachukwu gwara BBC na ihe ha kuturu bụ ụlọ alawaaghara ndị omekome were mere ebe ozuzo ha.
Ọ sị na o nweghi ụlọọgwụ ọbụla Okorocha rụrụ nke gọọmentị Uzodinma ha kuturu kama na ọ bụ ụlọ a na-arụchabeghi n'ọdọahịa Ekeukwu ọ kụturu wee na-arụ.
Ogwubike sị na gọọmentị Uzodinma chọrọ iweghachite ahịa Ekeukwu n'ebe ahụ ọ nọ tupu Okorocha akụtuo ya.
Mgbe a jụrụ ya maka okporoụzọ ọjọọ dị n'Imo Steetị, ọ sị na ọ bụ maka gọọmentị na-eche ka udummiri laa, ka ha nwee ike malite ọrụ n'ọkọchị.
Na dị ka ọ na-ekwu ugbua, na ọrụ amalitela n'ọtụtụ okporoụzọ dị n'Imo Steetị ugbua.
Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam onwuamaedo sị na obi adịghị Okorocha mma maka ụlọọgwụ Uzodinma kuturu chọrọ ịrụ ihe ọzọ.
Ọ sị na ọtụtụ ọrụ gọọmentị Okorocha ji ego ọhanaeze ndị Imo rụọ, gọọmentị ọzọ abata bịa na-akutusi ya.
Na o nweghi onye ọ ga-adị mma n'obi chaa chaa.