Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.

Kpọga m na weebụsaịtị izizi

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụfọdụ mba Afrịka ga-amalite ịkwụ puku dọlla 15,000 iji mee njem

    Onyeisiala Donald Trump etinyela iwu ọhụrụ kwuru na ndị si ụfọdụ mba Africa ga-egosi ihe ruru puku dọlla iri na isii maọbụrụ na ha chọọ ịme njem na mba Amerịka.

    Trump kwuru na ọ bụ n'ihi nnọfe oke ndị si mba ahụ na-afọ akwụkwọ ikike njem mere eji manye ya bụ iwu.

    Mana nchọpụta gosiri na Naịjirịa esoghi na mba ndị akpọrọ aha.

    Mba ndị ahụ gụnyere Angola, Burkina Faso, Chad, Democratic Republic of Congo, Djibouti, Eritrea, Gambia, Guinea-Bissau, Liberia, Libya, Mauritania, Sudan, Sao Tome and Principe, Cape Verde, Burundi.

  2. Gọọmentị etiti agbarụọla ihu dịka 39,070 gbahapụrụ iwu Covid-19

    Gọọmentị etiti agbarụọla ihu maka etu ndị na-eme njem abata Naịjirịa sị agbahapụ ịkwụ ụgwọ nakwa ịme nyocha ọrịa covid-19.

    Onyeisi ngalaba mgbochi coronavirus bụ Boss Mustapha kwuru na ha akwadowela ịda ndị mmadụ na-eme ihe ahụ nha.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ndị mmadụ na-eji asambodo nyocha ọrịa ahụ nke adigboroja abata Naịjirịa.

  3. Naịjirịa ga-apụta n’ọtanisi n’agba mbụ nke afọ 2021

    Mịnista na-ahụ maka ego, bọgeti na nhazi obodo bụ Zainab Ahmed ekwuola na Naịjirịa ga-apụta n’ọtanisi n’agba mbụ nke afọ 2021.

    O kwuru nke a n’emume iri abụọ na isii Nigerian Economic Summit nke Bigerian Economic Summit Group na ngalaba ya hibere.

    Naịjirịa banyere ọtanisi ya nke abụọ n’ime afọ ise n’agba nke atọ nke afọ 2020 dịka Gross Domestic Product (GDP) daturu ọzọ. Ahmed kwuru na ọtanisi a covid 19 butere bụ ihe metụtakwara mba ụwa ebe ọtụtụ mba banyerela ọtanisi.

  4. Ndewonu ndị bee anyị

    Anyị na anabata unu taa n'ikpa akụkọ ụwa anyị ka o si eme ugbua.

  5. Nkeji coronavirus

    Gee nkeji ihe mere n'Afrịka maka coronavirus taa.

  6. Ụlọikpe na Pọtakọt atụọla ndị ofesi isii nga afọ asaa maka ohi mmanụ agbịdị

    Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwuola na ọkaikpe J.K. Omotosho atụọla mmadụ asaa bụ ndị mba ofesi nga afọ asaa maka ori mmanụ agbịdị.

    N'ime ndị a: mmadụ abụọ - Mohammed Ejaz, Nasser Khan - bu ndị Pakistan; Abuọ bu ndị Yụkraịn -Oleksandr Nazarenko na Oleksandr Kashernvi.

    Otu onye Gana, aha ya bụ Romeo Annang sokwa n'ime ha.

    Onye ọzọ bụ Fredrik Fatin Omenu bụ inye Indonesia.

    Otu onye Naịjirịa aha ya bụ David Otuohi sowka rite nga afọ asaa.

    Ụlọ ikpe ahụ tụghapụrụ mmadụ atọ ọzọ si ofesi Victor Mikpayi (onye Bini), Francis Ahorlu na Kwesi Attah (bụ ndị Gana), nakwa Victor Azebiri (Onye Naịjirịa).

  7. Mba Saudi Arebiya agọọla na Onyeisiala Izrel zutere Nwa Eze ha

    N'agbanyeghị na ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ na Izrel na-ekwu na onyeisiala mba ahụ bụ Benjamin Netanyahu gara mba Saudi Arebiya izute Nwa Eze Mohammed Bin Salman, ndị Saudi sị na ọ bụghị eziokwu.

    Nwa Eze Faisal bin Faisal Al Saud dere n'akara Twitter ya na "onweghe nzute di etu a mere."

    Maazị Netanyahu ekweghi ikwu okwu banyere ihe a oge a jụrụ ya.

    Ya bụru na ha zutere n'eziokwu, ọ ga-abụ mbụ aka na-achị mba abụọ ga-ezute.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-akwaisi ike ka mba abụọ a kpezie dị ka ọ hazichara mkpezi Izrel na mba Unted Arab Emirates, Bahrain na Sudan na nso nso a.

  8. Ọgbwụ mgbochi covid-19 nke mahadum Oxford egosila na ọ dị ire

    Otu ọgwụ mgbochi emepụtara maka nje covid-19 mahadum Oxford dị na mba Briten na-arụpụta egosila ama na ọ ga-ere ruo pacenti 70 na nyocha mbụ mana ndị ọkachamara na-ekwu na o nwereike ruo pacenti 90 ma ya bụrụ na a rụtụ ya aka.

    A na-ahụ mpụtara ndị a dịka nnukwu ihe na agbanyeghị na ọ pụtara n'azụ Pfizer na Mordena wepụtara nke ha a sị na-ere ruo pacenti 95.

    Mana, ọgwụ mgbochi Oxford adaghi ọnụ ruo nke ndị ọzọ. Ọzọkwa bụ na ibugharị ya di mfe karịa ndị ọzọ.

    Ọgwụ a ga-arụ ezigbote ọrụ n'ịhụ na agha a na-egbuso coronavirus ma ya bụrụ na e nyere ikike iji ya.

    Ọkamụta Sarah Gilbert sị: "Akụkọ maka ọgwụ a na-akpọta anyị nso oge anyị ga-ejiri ọgwụ mgbochi kwụsị mkpa mkpa coronavirus na-akpa."

  9. Ụlọikpe sị ka akpọchie Sinetọ Ndume na nga maka akaebe ọ narala Maina

    Ụlọikpe dị n'Abuja ekwuola ka akpọrọ Sinetọ si Borno steeti bụ Ali Ndume na nga maka akaebe ọ natara Abdulrasheed Maina bụ onye a na-acho achọ ugbua.

    N'ụlọikpe na Mọnde, Ọkaikpe nyere iwu ka akpụrụ Ndume gawa mkpọrọ maka na ọ kpọtaghị onye ọ narala akaebe.

    Gọọmentị Naịjirịa na-ekpe Maina ikpe maka ebubo mpụ na nrụrụaka mere oge ọ nọ n'ishi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike na Naịjirịa.

  10. FIFA amachiela onyeisioche CAF ruo afọ ise

    International Federation of Association Football FIFA amachiela onyeisioche CAF bụ Ahmad ruo afọ ise maka nrụrụaka na mpụ.

    A dakwuru ya nha ruru dọla puku narị abụọ($200,000). Ahmad ekweteghị na o nwere njọ o mere .

    Akụkọ ka na-abịa

  11. Atọghapụla ụmụakwụkwọ 9 si ABU a tọọrọ na Kaduna.

    Atọghapụla ụmụ akwụkwọ itoolu nke Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria na Kaduna steeti n’ụbọchị Satọde.

    Ọnụ na-ekwuchitere ụlọakwụkwọ ahụ bụ Mallam Auwal Umar bụ onye gbara ama mana o kweghi ekwu ma ezinaụlọ ụmụ akwụkwọ ahụ akwụrụ ụgwọ tupu atọghapụ ha.

    Mana dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si kwuo, otu nna atọọrọ nwa ya sị na ọ kwụrụ ego karịrị naira puku narị ise.

    O kwukwara na o rere ụfọdụ akụnaụba ya tupu o nweike mezuo ego ahụ a gwara ya kwụọ.

  12. Gọvanọ Nyesom Nwike etinyela mmachi ngaghari ọzọ na steeti ya

    Gọvanọ Rivers steeti bụ Myeson Wike etinyela mmachị ngagharị na steeti ya ruo awa iri abụọ na anọ n’ụfọdụ akụkụ steeti ahụ dịka emume ndị omekome na-arị elu nakwa mwakpo.

    Ọ kpọpụtara ebe ahụ mmachị a ga-adị kpọmkwem dịka okpuru akwammiri Okoro-Nu-Odu dị na Rumuokoro ruo izụ ụka abụọ.

    Mana otu ụlọọrụ na-arụ ọrụ n’okpuru akwammiri ahụ agaghị esonye na mmachị ahụ ka ọrụ wee na-aga n’iru.

    Gọvanọ Wike dọkwara aka na ntị ịta ntoroọbịa ọbụla gara n’ihu mebie udo na ezi nchekwa dị na steeti ahụ.

  13. Ụnụ asaala chi?

    Nke onye chiri ya zere.

    Soro anyị taa ka ịmata akụkọ kpụ ọkụ ọnụ na Naịjirịa na mba ụwa niile.

  14. Welite ụtụisi maka ndị ọgaranya - Atiku gwara Buhari

    Osote onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Atiku Abubakar ekwuola ihe Naịjirịa nwere ike ime iji si n'ọtanisi (recession) pụta.

    O kwuru na otu n'ime ha bụ iwelite ụtụisi maka ihe ndị galara ọnụ nke ọ bụ naanị ndị ọgaranya na-azụ ha.

    Atiku depụtara nke a n'akara Twitter ya ma kwuo na ihe kpatara Naịjirịa ji banyekwa n'ọnọdụ ọtanisi ọzọ bụ maka na ọchịchị Buhari egeghị ntị na ndụmọdụ ndị ọkachamarta na-enye gbasara ibelata ego a na-emefu na gọọmentị.

    Lee ihe Atiku kwuru ka e mee iji si n'ọtanisi pụta:

    • Megharịa bọjeetị 2021 maka na nke e meburu eme agaghị enwezi isi
    • Tinye ụtụisi poasentị iri n'ise na ngwa ahịa galara ọnụ (luxury goods)
    • Wepụ ọtụtụ mmefu dị na gọọmentị
    • Tinye ego na mwulite ndị mmadụ (human development)
    • Mee ka ndị ogbenye nwee ego ha ga-eji egbo mkpa
    • Kee ndị onweghị ka ọ ha ha ego site n'akara ọbaego ha
    • Tinyekwuoro ụlọorụ mmanụ agbidi nakwa ụlọọrụ ụgbọelu ndị mba ofesi ụtụisi otu pasentị
    • Wetuo ego ihe oriri na ihe ụmụ ogbenye na-egokarị
    • Gọọmentị kwụsi ibi ego aghara aghara
  15. Ndị omekome egbuola onyeisi pati PDP na Katsina steeti

    Ndị otu Peoples Democratic Party (PDP) akwaala arịrị maka ọnwụ onye otu ha bụ onyeisi pati ha n'okpuru ọchịchị Sabuwa dị na Katsina Steeti bụ Alhaji Lawal Dako.

    Dako nwụrụ n'aka ndị omekome ụbọchị Frịade ka ha gbachara ọnụ egbe ise.

    Nke a bụ onye ndọrọndọrọ ọchị abụọ ndị ajọ mmadụ a na-egbu n'ọnọdụ dị otu a n'abalị atọ.

    N'ụtụtụ taa ka anyị nwetere akukọ maka onyeisioche ndị APC na Nasarawa steeti bụ Phillip Shekwo bụ onye ndị ntọ tọorọ gbuo.

    Dako n'onwe ya ka akụkọ na-ekwu na ọ nwụrụ ụbọchị Fraịde maka egbe ndị omekome ahụ gbara ya.

    Ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum Ahmadu Bellow dị na Zarịa.

    Onyeisi PDP na steeti ahụ, bụ Salisu Majigiri, bụ onye kwuputara nke ahụ sị na "ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ ebe ahụ" .

    Akụkọ na-ekwu na ndị ahụ gbagbukwara nwa nwa Dako n'otu mgbe ahụ.

    E lielarị Lawal Dako gbara afọ iri isii (60) n'ụzọ okpukpere chi ndị Alakụba.

    Ọnwebeghị ihe ndị uweojii kwuru maka ọnwụ ya bụ nwaamadị.

  16. Gọvanọ Nasarawa aṅụọla iyi ịchọta ndị gburu onyeisi pati APC steeti ahụ

    Gọvanọ Nasarawa Steeti bụ Abdullahi Sule ekwuola na ha ga-anwụchirịrị ndị ekperima gburu onyeisi pati APC nke steeti ahụ bụ Phillip Shekwo.

    Sule kwuru nke a dịka ndị uweojii kwupụtara na ha ahụla ozu Shekwo, bụ onye ndị ntọ tọọrọ n’abalị Satọde.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Bola Longe kwuru na ha hụrụ ozu nwoke ahụ n’akụkụ ọhịa dị nso na be ya.

    Gọvanọ Sule kọwara Shekwo dịka nwoke anaghị achọ nsogbu, ma bụrụkwa ezigbo onye otu APC.

    O kwuru na ọnwụ Shekwo gbawara ya obi, ma bụrụkwa nnukwu ihe ọdachi nye ezinụlọ ya nakwa ndị steeti ahụ niile.

    Ọ gara n'ihu kwuo sị: "Ọchịchị anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ma tinye ihe niile anyị nwere ike iji hụ na ndị kpara arụ a alaghị n'ụkpọrọ."

    "Anyị ga-agbakwa mbọ ole ike kwere anyị ichekwa ndụ na akụnụba ndị mmadụ na steeti anyị."

  17. Ihe mere '9ice' na-agụ egwu ji arịọ nwunye ya mgbaghara

    Abolore Adegbola Akande bụ otiegwu ama ama dịka 9ice anọrọla n'elu intanet rịọ ụmụ Naịjirịa ka ha rịọ nwunye ya arịrịọ maka agwa ọjọ ọ kpara gbara n'elu intanet.

    N'ime onyonyo ahụ na-efegharị n'elu intanet, Nice kwuru na ọ na-rịọ nwunye ya mgbaghara maka ihe ọjọ o mere ma na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa soro ya rịọ nwunye ya mgbaghara.

    Gịnị bụ ihe ọjọ ahụ ọ sị o mere?Ihe anyị ma

    O nweghị ihe Nice tụrụ aka bụ ihe ọjọ o kwuru o mere mana ihe nkiri ebe ya na nwaanyị ọzọ ọ kpọrọ nwunye ya na-efegharị n'elu intaneti.

    9ice alụọla nwaanyị ugboro atọ. Ọ bụzo lụọ Toni Payne mgbe ọ ka na-amalite iti egwu ọhụrụ n'afọ 2008. Ha nwere otu nwa tupu ha agbasaa maka ebubo ịgba n'ezi.

    N'afọ 2018, ọ lụrụ Adetola Anifalaje, onye na-arụ n'Amerka. Ha mụrụ otu nwa nwaanyị tupu ha agbasaa.

    Aha nwunye ya ọ na-alụ ugbua bụ Olasunkanmi Ajala Akande bụ nke ọ na-arịọ ka ndị nso nso ya rịọ mgbaghara maka ihe ọjọ o mesoro ya.

    Ihe ọ bara onyonyo mgbaghara ahụ o wepụtara n'elu instagram bụ Ụgbọ na-emi emi.

    Ihe ndị mmadụ sara arịọrịọ ya n'elu soshal midia

  18. Ndị ntọ atọrọla onyeisioche APC na Nasarawa Steetị

    Ndị uweojii Nasarawa Steeti kwuru na ndị ntọ atọrọla onyisioche pati APC na steetị ahụ bụ Philip Shekwo.

    Komishọna uweojii bụ Bola Longe sị na a tọọrọ Shekwo n’ụlọ ya n’elekere iri na otu nke abalị Satọde.

    Longe sị na a matabeghi ndị tọọrọ ya kama na o zipu ndị uweojii ka ha sie imi n'ala chọpụta ebe ndị ntọrị a nọ.

    Ka ọ dị ugbua ntọrị, ohi na mwakpo na-arị ibe ya elu, ọkachasị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

  19. Ọkaikpe awụọla Trump n'ala na mkpesa o mere na Pennsylvania

    Ọkaikpe na Pennsylvania akachapụla akwụkwọ Trump gbara sị ka akagbuo ọtụtụ nde vootu e zitere n’ozi na Steetị ahụ n’oge ntuliaka.

    Ọkaikpe a bụ Mathew Brann sị na mkpesa a Trump nyere gbakwasịrị ụkwụ n’ebubo achịtaghị aja.

    Nke a ga-eme ka nkwupụta mmeri Biden meriri Trump na Steetị ahụ gbaa mgbọrọgwụ n'izuụka na-abịa dịka o ji ihe karịrị vootu puku iri asatọ akarị Trump.

    Ọ bụ ezigbo nsogbu nye Donald Trump, bụ onye na-achọ ịgbanwe mmeri e meriri ya na ntuliaka onyeisiala e mere n'ụbọchị atọ nke ọnwa Nọvemba.

    Ọ jụla ịnabata mmeri ma bo ọtụtụ ebubo metụtara nrụrụaka na ntuliaka, na-enweghi ihe akaebe.

    Isi akwara ọ na-agba ịnabata mmeri e meriri ya emetụtala usoro ihe na-eso ntuliaka mba Amerịka.

  20. Mmadụ 246 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde

    Coronavirus ka dịkwa ire dịka ọnụọgụgụ ndị butere ya na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde dị narị abụọ iri anọ na isii site n’ozi ụlọọrụ mgbochi ọrịa bụ NCDC wepụtara.

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a kamgbe ọ batara Naịjirịa ji karịa puku iri isii na puku isii, ebe ndị nwụrụ dị otu puku na otu narị na iri isii na isii.

    Ndị gbakwara akarịala puku iri isii na otu puku.