Dịka okwu dị n'etiti Onyeisi otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na Osote ya bụ Uche Mefor na-abawanye, ogige otu ahụ a kpọrọ "Directorate of State" (DOS) apụtara kwuo na ha akagbuola ọkwa Osote Onyeisi na ya bụ otu.
N'ime akwụkwọ Maazị Chika Edoziem - bụ onye zara aha ka onyeisi DOS - binyere aka, ha si na ha na-eme nke a makana "onweghi ebe ọbụla a na-eme nwereonwe a na-enwe osote onyeisi".
Ha gakwara n'ihu kwuo ọtụtụ ihe ha sị Maaazị Mefor mere megide Ipob na onyeisi otu ahụ.
Ebubo a gunyere ịgba mgba okpuru megide ndị Ipob na-achọ ịbata mba Briten maka ọsọ ndụ nakwa inupuru Nnamdi Kanu isi site na ịgbajọ iwu o tinyere.
BBC gbara mbọ ịnụta n'ụnụ Maazị Mefor mana ọ saghị ozi eziri n'ekwentị ya.
Mana Mefor dere n'akara Facebook ya ma kwuo na mgba okpuru niile ndi Ipob na-agba ya agaghị amịta mkpụrụ.
Mefor kwukwara na ọ bụ onyeisi Ipob na ndị DOS na ebuso ya agha.
Akwụkwọ ahụ kọwakwara na Ipob wepụrụ onye na-ahazi Mab Aemrịka bụ Obidi Obienu n'ọkwa maka nnupu isi.