Okwu a kpụ n'ọnụ n'ụbọchị Sọnde bụ ogbugbu ndị ọrụ ubi karịrị mmadụ iri anọ na atọ na Borno Steeti.
Otu onye aha ya bụ Usman Ismail, onye hụrụ etu ya bụ ihe si mee, kọọrọ ndị ntaakụkọ ihe merenụ.
Ismail kwuru na ndị Boko Haram na-abata n'obodo ha kwa mgbe kwa mgbe na-amanye ndị mmadụ amanye inyere ha aka.
O kwuru sị: "Ọtụtụ oge ka ha na-abịa amanye anyị ka anyị buru ibu ha si n'ebe a baa n'ime ọhịa ebe ha bi."
"Onweghi ihe anyị ga-emenwu n'ihi na ha bucha egbe, mana ha na-ekwu na onwghị ihe ọbụla ha ga-eme anyị."
"Ọtụtụ oge, anyị na-arahụ n'ubi anyị n'ime ọhịa n'ihi na onweghị ihe ha na-eme anyị. Ọ bụladị n'abalị ụnyaahụ (Satọde), anyị rahụkwara n'ubi anyị."
"Oge anyị hụrụ ha ka ha na-akpọkọ ndị mmadụ, anyị chekwa na ọ bụ ka anyị nyere ha aka etu anyị si emebu na mbụ."
"Ha malitere ịkpọrọ ụfọdụ baa n'ime ọhịa mana ndị ahụ agaghị eso ha apụta. Ha akpọrọkwa ndị ọzọ baa n'ọhịa, ndị ahụ agaghị eso ha pụta."
"Oge ahụ ka ụfọdụ n'ime anyị ji malite ịtụ egwu wee chọwa ụzọ ịmịpụ ma gbaghachi azụ n'obodo."
Oge ndị ntaakụkọ jụrụ Ismail ihe kpatara na ha akpọghị ndịagha oge ha hụrụ ndị ekperima ahụ, o kwuru sị:
"Anyị anaghị eji ekwentị anyị aga ọrụ n'ihi na ha ga-anara gị ya. Ọ bụrụ na ha nara gị ekwentị gị, gịnị ka ị ga-eme?"
Ismail kwuru na mwakpo ahụ malitere n'elekere asaa nke ụtụtụ, mana ọ bụ n'elekere iri na otu ka ha nwetara ohere ịmịpụ ma gbaa ọsọ. Tupu ha erute n'obodo ha, ọ kụọla elekere atọ nke ehihie.
Ọ gara n'ihu kwuo na osikapa ha kọrọ mere nnọọ nke ọma n'afọ a, mana ha amaghịzi etu ha ga-esi gaghachi n'ubi ha bute ya.
Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum kwuru na ha ga elebagharị anya n'usoro ha ji ebuso ndị ekperima Boko Haram agha.