A nwụchịrị nọọsụ 12 na Delta steeti? Lekwa ihe anyị chọpụtara
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ dọkịta Mordi Ononye ekwuola na onweghị ndị nọọsụ ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụbọchị Fraide bụ December 4,2020.
O kwuru na ndị uweojii kpọpụrụ ndị nọọsụ batara ime ebe ndị nọọsụ ndị ọzọ nọ na-ele ule n'otu ụlọakwụkwọ mana ha anwụchịghị ha kama ha na ha gara inwe mkparịtaụka ka ha wee kwụsị ighasasi ule a na-ele ebe ahụ.
Mana odeakwụkwụ ndị otu nọọsụ na Delta steeti bụ Chukwuka Ezugwu kwuru na ndị uweojii steeti ahụ nwụchịturu ma hapụkwa ndị otu ha mgbe ha gara ile ma ndị ụlọakwụkwọ nọọsụ ndị ọzọ nọ na steeti ahụ esonyere na abụbụ ọrụ ha kanyere ụbọchị Fraide ahụ.
Ezugwu kwuru na ndị otu nọọsụ steeti ahụ gbara arụkwaịm maka ihe ha kpọrọ nneni na mmaja gọọmenti na-eme ndị nke ha site n'iwere onye nọọsụ nọ n'obere ọkwa tinye n'ọnọdụ onye nọọsụ nke ukwu kwesiri nọ nakwa mkpa ndị ọzọ.
Kọmịshọna Ononye kwuru na gọọmenti hibere otu na-elebanya na mkpa ndị a nakwa e nyere ha ruo ngwụcha Jenụwarị iweta ogbugbo nye mkpa ndị ahụ.